11 Comments

  1. 1. Nwayọọ ka eji aracha ofe dị ọkụ

    2. Nkịta nwere ndidi na ata ọkpụkpụ siri ike

    3.Onye ndidi na eri azụ ukpoo.

    4. Onye ndidi nwe mmeri.

    5.Onye amaghị iwe amaghị ihe ọma

    6. Nwayọ bụ ije.

    7. Onye iwe ọkụ na ebu onye arụrụ ala ụzọ anwụ.

    8. Ndidi ka ebi ji amụ nwa ogwu juru ahụ niile.

    9. Iwe nwanne anaghị eru n’ọkpụkpụ.

    10. Egbue n’iwe egbubie ọkpụkpụ.

    11. Akụ waa n’iwe akpịkwaa ya n’iwe.

    12. Oji nwayọ aga, anaghị emerụ ahụ.




    0



    0
  2. Author

    1. e jighi iwe oke esu ụlọ ọkụ
    2. chinchi sị ụmụ ya nwee ndidi na ihe dị ọkụ ga eju oyi
    3. gbanụ gbanụ gbujie ji, e were nwayọ gbuputa ọdụ ya
    4. onye iwe ( oke obi) na ebu onye ajọ mmadụ ụzọ anwụ
    5. iwe nwanne anaghị eru n’ọkpụkpụ




    0



    0
  3. Author

    1. Egbuo n’iwe, e lie n’ọnụma
    2. e gbuo n’iwe, e lie maka isi (smell )
    3.




    0



    0
  4. 1. Onye ndidi na-eri azu ukpoo.
    2. Agburu ji iwe akwu ugwo, agbogho ewu anaghi eme be ha.
    3. Nwata a na-etiri aki amaghi na iwe na-ewe nkume.
    4. Nwatani siri n’ala akuru ya anaghi ewe ya iwe, kama o bu onye si gbaa ya n’ala.
    5. Ezi si n’iwe ya bu na onye nwe ya na-aga na-azu ogu n’ahia ebe ya no n’ulo were onu ya na-egwu ala.
    6. Ogba-nta okwa g’ejikwa nwayo n’ihi na mgbugba na ngongo di okwa na ahu kariri akari.
    7. Egbue n’iwe, elie n’iwe.




    0



    0
  5. 13. Ogbugbu ana-egbu ebule na-ewe atụrụ iwe.

    14. Eji iwe ududu akpọ ụyọụyọ ọkụ.

    15. Eji iwe nwa ebule abọ nwa mkpi.

    16. Ọna abụ iwe eweghị ji o wee mma?

    17. Ọkụkọ hapụrụ iweso mma gburu ya bia na-atụgọbara ite ofe olu.

    18. Esu sịrị na iwe eweghị ya bia webe onye zọrọ ya ụkwụ.




    0



    0
  6. 8. Anaghi eji maka iwe oku muo ulo oku.
    9. Idi nwayo abughi adighi like.
    10. Nnekwu okuko kwuru si na obughi olulu okookpa na-alu ya na-ewe ya iwe kama na o bu mmebo o na-emebo ya n’ihu oha.
    11. Iwe wechaa onye echiche, o ga-ebiri onu ya?
    12. Onye iwe oku anaghi eri ekpe.
    13. Odighi mma iji iwe dughudu wee kpoo yoghoyo oku.
    13. Ochu na-ala n’ike, oje na nwayo anaghi emeru ahu.
    14. A lia dike n’ubochi ogu, o were iwe tuo ogu na ndi o Jere eje.
    15. Onye wee iwe, osi n’ike taa ahu.
    16. Ota aki anaghi ama oge iwe di nkume.
    17. Onye iwe oku na-ebu onye metera nso-ala uzo anwu.
    18. “Ndo” anaghi agwo oria, ma onye kwesiri ikwu ya ekwughi ya, iwe a di.




    0



    0
  7. 19. Elie ozu, elie iwe na onuma.
    20. Iwe egwu anaghi ewe onye ukwu ya n’agbajighi agbaji.
    21. Okuko si na ihe iwe ji ewe ya ebe a na-anyacha okwa bu maka na anu-abuba nile bu otu.
    22. Obu iwe onwu kpatara okuko ji abu anuo mmiri , ya elelia anya elu.
    23. Ije uwa bu nwayo nwayo.
    24. O na abu nkita richaa nsi kwaa igbegiri iwe egbuwe onye nkita riri nsi ya.
    25. O bu onu kwutere ihe obi ji gbaa iwe.
    26. Nti si na ihe na-ewe ya iwe bu na o bu onu na-ekwute ihe eji ama ya ura.
    27. Iwe di n’obi ma ochi di n’eze.




    0



    0
  8. 19. Okwu dị nro na eme ka iwe na ọnụma laa azụ.

    20. Ejighị ọchị eze ama iwe obi.

    21. Ejighị igba egwu akpasu onye nwere ụkwụ iwe.

    22. Ejiri iwe kwụọ ụgwọ arụ ọ pụọ nsị.

    23. Onye ji nwayọ eri ji nwayọ adị ndụ.

    24. Nwa ogbenye anaghị akpa iwe.

    25. Were nwayọ tọọ ntị n’ala ka ị nụ ụya danda.




    0



    0
  9. Author

    1. Ọkụkụ sị na ihe o ji abụ ọ vọga ihu ọ vọga azụ bụ ka ya were nwayọ na-achọ ihe dị n’ala
    2. nwayọ nwayọ ka e ji abata n’ihu ( n’ọgbọ ) egwu
    3. ndidi ( ire ọma) ka ejula ji aga n’ogwu
    4.




    0



    0
  10. 26. Okenye ji nwayọ nwayọ arụnye aka n’ike.

    27. Ataa nwa ngwụrọ ụta ọgụ o jiri iwe gbue mmadụ.

    28. Nke mbụ abụghị nsogbu mana ọzọ bụ iwe m.

    29. Nwayọ ka eji aracha mkppịsị aka maka na anaghị afanye ya n’uko.

    30. Okwu iwe na-akpa ọgụ.

    31. Nwayọ na nganga ka okenye ji agbara ehi ọsọ.




    0



    0
  11. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: SAI NWENYA 21 ( n’ime 25 )MAZI IKE BISMARCK ỌJỊ 8 (n’ime 10 ), UJU NWANEKEZIE 19 ( n’ime 27 ). MAZI SAI NWENYA ETURUWO UGO




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.