NDI ỌKADA ỌNICHA GA-ALARỊRỊ – Obianọ

Spread the love

Aka na-achị steeti Anambara bụ Willie Obianọ ekwuela na ọ bụ iwu na-aga-amachị iji ọgba tim tim ejiri ọkada mara, ibu ndi njem n’Onicha malite n’abali mbụ nke ọnwa asaa n’afọa.

Obianọ kwuru hoohaa, na etiela iwua bụ na etiela ya. Onweghị ịla azụ n’ime ya.

Ọbụ n’ime onwa ise n’afọa ka gọọmenti steeti Anambara kwuru na-aga akwụsị igba ọkada na ebe ụfọdụ na ya bụ steeti.

Mgbe ọ na-ekwu okwu na ọgbakọ ọmụmụ ihe kwa afọ ndi eze ọdị n’ala steeti Anambara nke afọa, yabụ aka na-achị steeti Anambara kwuru na iwu mmachia ga-adị ire na Onicha, Ọka nakwa gburugburu ha.

Obianọ kwuru na ana-etinye owu n’ọnụ aga maka ichịpụta ụmụ ụgbọ ala bọs aga ejizi na-ebu ndi mmadụ site n’otu akụkụ gawa akụkụ ọzọgasị n’ime ebe ndi mmachia metụtara. O kwukwara na ana-ahazikwa usoro ibunye ndi na-agba ọkada ugbua ụgbọ nwere ụkwụ atọ ejiri keke mara, maka iji nọchitezia ọkada. Ọ sịrị na aga-ebunye ha n’ụdị ha ga na-akwụnye ka aka ha ha ganye na ha akwụtọpụ. Obianọ kpọkukwara ọhaneze ka ha were oherea tinye iji obere ụgbọ ala bọs dịka ụzọ ichụ nta ego n’ebe ndia amachigasịrị igba yabụ ọkada.

Onye ọchịchịa kwuru na mmachi ana-amachị igba ọkada na ebe ndia bụ maka ọdị mma ọhaneze, n’ihi na nkea ga-enye aka ịkwụsịnata ụdị ọri eji ọkada ezu.

N’okwu nke ya, onye isi oche ndi ọchịchị omenala na steeti Anambara bụ Igwe Nnaemeka Achebe kwuru mkpa ọ dị na ndi ọchịchị omenala na-enyere ndi gọọmenti aka maka iweta ezigbo nchekwa, udo nakwa mmepo obodo. Igwe Achebe sịrị na nkea ga-eme ka usoro ọchịchị dịrị ndi gọọmenti nfe.

Leave a Reply

Your email address will not be published.