AKA KPARA NDI AGHA ISIS ABỤỌ N’ABUJA

Spread the love

Ndi ọrụ nche obodo nke akpọrọ Department of States Services, DSS, n’aha ichafu nọrọ tata kwue na ha anwụchiela mmadụ abụọ bụ ndi ọlụọ ọlaa amara dịka ISIS na Gwagwalada dị n’Abuja.

Mmadụ abụọ ndi a bụ ndi akpọrọ aha ha dịka Bashiru Adams nakwa Rufai Sajo.

Ozi ndi ọrụ DSS sitere n’aka Mazi Tony Opuiyo n’Abuja na-ekwu na ọbụ n’abalị ise nke ọnwa gara aga bụ Mee ka aka kpara mmadụ nabọ ndi a.

Ndi ọrụ DSS kwukwara n’otu aka ahụ, na anọrọ n’ahịa Muda Lawal dị na Bauchi jide otu onye ana-enyo enyo dika onye ọrụ IS ngalaba nke ọdịda anyanwụ Africa ka ọnwa anọ n’afọ a dị na abalị iri abụọ na asatọ. Ozi a kwuru na aha nwoke a bụ Umar Dogo.

Mazi Opuiyo kwuru na nnyocha emere gbasara ndi a na-egosi na ha na-eme njikere, ha na ndi Boko Haram ijikọ aka ọnụ buso ndi onweghị ihe ọjọọ ọbụla ha mere ha agha n’ụdị ụzọ ejiri mara ha.

Ndi DSS kwukwara na site na ụmụ ọzi dị añaa ha nwetara, na ha nwụchikwara mmadụ abụọ ndi aka ọrụ ha bụ irụ ngwa agha ogbunigwe. Ha sịrị na aha ndi a bụ Adamu Hassan eji Bale mara nakwa Abubakar Abubakar eji Alhaji mọbụ Buba mara.

Mazi Opuiyo kpọkuru ọhaneze ka ha gbaa mbọ na ime ka ndi ọrụ nchekwa mata mgbe ọbụla ha hụrụ ndi mọbụ ihe ana-enyo enyo n’ebe obibi ha.

Leave a Reply

Your email address will not be published.