AGAM ANỌCHI EKWEREMADỤ – Uche Onyekwere.

Spread the love


Onye ahụ bụburu igwe ndi Agbadala/Aham, (obodo kwụrụ onwe ha) n’Achị dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Oji River nke steeti Enugu, n’ụdị lee ya jidere m, bụ Ichie Uche Onyekwere ekwuputala ebum n’obi ya izọ oche ndi ọdịda anyanwụ Enugu n’ụlọ omebe iwu sineti, ala anyị. Uche Onyekwere, nke ebum n’obi ya bụ ịnọchi Dọkịnta Ike Ekweremadụ ji ọkwa osote onye isi n’ụlọ omebe iwu sineti ma bụrụkwa onye otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị PDP, ekwuela hoohaa, na ya adịla njikere ịzọ yabụ ọkwa ebe ọ bụ na onye nọbụ ebe ahụ bụ Ike Ekweremadụ ka nọ n’ụdị ọ bụ mụ gawa ka ọ bụ mụ agana.

Uche siri na Dọkinta Ekweremadụ emela ka ndi ọrụ ya mata na ya aka amabeghị ma ya ga-azọ ọkwa ahụ ma ọbụ na ya agaghị azọ ya. Ekweremadụ anọọla na ya bụ oche ndi ọdịda anyanwụ Enugu afọ iri na isii.

Nwoke a bụ Ichie Uche kwuru na ka ihe si kwụrụ kita, na ana-achọpụta na ebe Ekweremadụ na-ebe akwa atụ aka bụ izọ ọkwa osote onye isi ala n’afọ puku abụọ na iri na itoolu na-abịa abịa. Ọ sịrị na ọbụ nke a mere oji bụzịrị oke rutere ndi Oji River ịnọrọ n’oche ndi ọdịda anyanwu Enugu n’ụlọ sineti.

N’okwu ya: ‘dịka onye kwụrụ onwe ya ma na-arụrụ onwe ya ọrụ, arụọla m ọrụ enyem aka nye ọtụtụ mmadụ ụwa na-ara ahụ. N’ihi nke a, ekwetala m na ndọrọ-ndọrọ ọchịchị chọrọ ndi dịka mụ bụ ndị nwere ike n’ọtụtụ ụzọ ime ka ihe gaa n’ihu nke ọma’

Ichie Uche kwuru na ya bụkwa onye rijugoro afọ nke na-agaghị enwe mmasị ịfọ ụfọ nfọjụ akpa.

Ọ sịrị na ka ihe si gbata kwụrụ ugbua, na ndi kwụrụ onwe ha na-abatazị na ndọrọ ndọrọ ọchịchị maka iweta mgbanwo ma mee ka owu na-aga ọfọma n’anya aga.

Ọ kwuru sị na ka esi kee ọnọdụ izọ ọkwa ọchịchị na mpaghara na mpaghara (zoning) nyere ya ezigbo ohere dịka onye si mpaghara Oji River izọ oche ndi ọdịda anyanwụ Enugu n’ụlọ omebe iwu sineti.

Ọ sị na Mazi Toby Okechukwu nọ n’ụlọ ndi nnọchite anya nke ndi ala anyị n’aha ndi Awgu, ebe Mazi Ude Okoye nọkwara ha dịka onye ndu ụmụ ntorọbịa. Ọ sịrị na ndi Udi na Ezeagụ buru oche osote aka na-achị steeti Enugu. O wee kwue n’ọbụ sọnsọ ndi ọchịchị ime obodo Oji River ka egwu ndọrọ ndọrọ ọchịchị gbarapụrụ na ọdịda anyanwụ Enugu. Ọ sị na ọbụ ịbanye na ọchịchị ya ga-edozi ajọ ọnọdụ a.

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.