Ndi DSS awakpoola ụlọ Abaribe maka Nnamdị Kanụ

Spread the love

Abụja: Ọ karịwo elekere atọ kemgbe ndi ọrụ nchekwa DSS ji agba kpuru kpuru n’ụlọ Sinetọ Enyinnaya Abaribe na mpaghara Apo n’Abụja. Onye ha na-achọ bụ Mazi Nṅamdi Kanu, onyeisi ndi IPOB.

Ka ha nọzị na-eme nkea, Ndigbo bi n’Abụja, ndi ihe nwa amadị a na-amasị nke ukwuu maka otu o si alụ ọgụ na ihe gbasara Ndigbo juputara n’igwe were gbaa ụlọ ahụ gburugburu.

Ọ dịzị ka ebe anọzị mmemme nche abalị, Oriakụ Grace Osunbor bụ agbatobi ha ma bụrụkwa nwunye Gọvanọ chịburu Edo Steeti bụ Ọkammụta Oserheimen Osunbor siri nri ma bunyekwa igwe mmadụ ahụ.

Ọtụtụ ndi mmadụ akatọọla akparamagwa ọchịchị aka ike a dika nke na ekwesịghị ekwesịghị n’ọchịchị onye kwuo uche ya ma bụrụkwa nke na -egosi akpọmasị ọchịchị Buharị nọ ugbua kpọrọ Ndigbo.

Ndi DSS ahụ, ka ha na-apụ chịkọrọ ekwentị Abaribe, bụrụ laptop ya ma nakọrọkwa ụfọdụ ndi ahụ gbakọrọnụ ekwenti ha. N’agbanyeghị nkea, o nweghị ihe ọbụla na-emebi aha mmadụ ha nwetara n’ụlọ ya.

Tọọ ntị n’ala maka akụkọ a……….

Leave a Reply

Your email address will not be published.