ONYE ‘AMỊ’ AHAPỤLA NDI BOKO HARAM GBAA ONWE YA

Spread the love

Ótú onye agha ekwubeghị aha ya, n’ime ndi na-alụso ndi Boko Haram ọgụ na steeti Borno; ka an-ekwu na oji egbe dulaa onwe ya mmụọ.

Ọ bụ na usuu ndi agha dị n’Ilọrị nke steeti Kwara ka-esi ziga nwoke a ihu ọgụ nke ndi Boko na steeti Borono.

Nwoke a gburu onwe ya ka-ekwuru na ọ malitere site n’iyi onye nche ọba ngwa agha egwu na ya ga-agbagbu ya. Mgbe onye nche ahụ jiri ọkpa zọrọ onwe ya, nwoke a ji ọkwa ‘captain’ tụdoro onwe ya egbe n’afọ ma dulaa onwe ya mmụọ.

Mbọ agbara izọta ndụ nwoke a amịtaghị mkpụrụ, ebe ọbụ na tupu eburuo ya ụlọ ọgwụ na onye dị ndụ abụrụla onye nwụrụ anwụ.

Ekwuru na nwoke a so ndi na-alụ ọgụ na okpuru ọchịchị ime obodo Mafa bụ ebe ọgụ Boko Haram kpụzị ọkụ n’ọnụ.

Ọ bụ na abalị iri na asatọ nke ọnwa Juun anyị nọ n’ime ya ka nwoke a gara bute egbe ya n’ọba ngwa agha n’ụdị na ya na-alọghachị ihu ọgụ echi ya. Onweghị ka esi mata ihe na-akpagbu nwoke a tupu na ihe mere emee.

Leave a Reply

Your email address will not be published.