BUHARI, OSINBAJO KWỤSỊNỤ OGBUGBU ANA-EGBU NDI MMADỤ NA PLATO – Ụmụ Naijiria

Spread the love


Ọtụtụ ụmụ Nigeria anọrọla n’ọba ozi ikuku di iche iche kpọkue aka na-achị ala anyị bụ Mohammadu Buhari nakwa osote ya bụ Osinbanjo ka ha gbaa mbọ kwụsị ogbugbu ana-egbu ndi ụka Kraist, ọ kachakwa na steeti Plato.

Ha rụtụrụ aka n’ogbugbu aka gburu naari mmadụ abụọ n’ime ụlọ ụka akpọrọ Church of Christ In Nations (COCIN) nakwa nke akpọrọ Regional Church Council, n’okpuru ọchịchị ime obodo Barkin Ladi nke steeti Plato.

Ndi uwe ojii nke yabụ steeti ekwuwokwa na egburu mmadu iri asatọ na isii n’agha ebusoro ndi Razat, Ruku, Nyarr, Kura nakwa Gana-Ropp nke ogbe Gashish, n’okpuru ọchịchị ime obodo Barkin Ladi. Ndi ọzọkwa bụ Daffo na Kuba ndi nke dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Bokkos na steeti Plato.

Mgbe ọtụtụ ụmụ Naijiria ụfọdụ na-ekwu okwu n’ikuku maka ajọ ọnọdụ a, ha kagburu nkịtị ndi ọchịchị anyị gbachiri ana-egbu mmadụ ka a na-egbu ụmụ anụmanụ n’ala anyị. Ha kwara arịrị rienne dịka nke a si gbasata steeti Plato.

Ha riọrọ Buharị ka ọ gbaa mbọ ahụrụ anya ma kwụsị ajọ ihe a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.