AJA/OKWUTE/UGWU

Spread the love

Aja/okwute/ugwu

5 Comments

  1. Author

    Aka ajaja na ebute ọnụ mmanụ mmanụ
    2. Taa mbụ kịrịrị taa abụọ kịrịrị, ọ bụ ji bụ aja ka ọ bụ akwụkwọ bu aja
    3. ugwu mụta mgbaji ukwu, agadi nwanyị amụta arịkata ezuwe ike
    4. onye isi nkwọcha anaghi eje ọgụ okwute
    5. ọsọ mgbada bụ n’ugwu
    6. isi akwụ dara n’ala emetụla aja




    0



    0
  2. Akpoo nkita uzo oku n’abu o bonye onwe ya aja n’anya.
    2. A naghi ama uru nkirika nkata bara wee rue mgbe a ga-ebufu aja.
    3. A na-egosi nwata awo n’ikpo okwute, a na-aturu ya aka n’ihi na awo na okwute na-eyiwe onwe ha.
    4. Akwa okuko tipia aki, ihere aburu nke okwute.
    5. Tun tun gem gem; oso mgbada n’ugwu.
    6. Mmadu si na nwata daa ibi, o tolite, o buru ya na-awu aja.
    7. Nwata muma agu egwu aja, okenye nwe anu.
    8. Aka aja aja na-eme onu mmanu mmanu.
    9. Okpoko utara dara n’ala edetula aja.
    10. Isi akwu dara n’ala edetula aja.
    11. Okpu aja dara olulu a laruola ikwu nne ya.
    12. Oso ugwu ga-emechaa buruzie mwuda mwuda.
    13. Onye bi n’ala anaghi eje ohi aja.
    14. Onweghi ebe egburu aja ngwere adighi.




    0



    0
  3. 15. A chuba aja ma ahughi udele, I mara na ihe mere be ndi mmuo.
    16. O diri okuko mma o wee were aja na-asa ahu.
    17. Achuba aja ipu n’ulo, oke tunye ego ngwere tunye ego; n’ihi na oku gbaa ulo, oke aburu oke-ohia, ngwere aburu ngwere-ikpa.
    18. Agadi nwanyi kachie nti wuo mgba aja, e bute isi ya n’ofe ya.
    19. E buru onu na-agba aja o na-esi mmuo mmuo.
    20. O buru na onwu egbuchughi ji e jiri chu aja, o ga-epuriri ome.
    21. Ugbo-ala na-ari ugwu ukpo ma nti ga-anu ya ihe.
    22. Okenye ji okwu achu onye ya aja.
    23. O na abu ekpudo nsi aja, erie mbughu.
    24. Ochie Dibia chuo aja, o dika o were ya nye ndi mmuo n’aka.
    25. Etikuo Dike n’ubochi ogu, o were onuma maa aja.
    26. Ugwu obula ahuru ego, nwa ngwuro ga-arili ya.
    27. A na-agwa ya okwu, o dika ebe a na-awusa mmiri n’elu okwute.
    28. Oburu na mgba aja adadoghi nwanyi ajadu, o naghi ama uru Di bara.




    0



    0
  4. 29. Irube isi ka ichu aja mma.
    30. Dimkpa lukata ogu malite ibo aja I mara na ike ogu agwula ya.
    31. O na abu ihe ghara ugwu o towa aja aja.
    32. Muo obula ejiri akwa okuko chuoro aja aghaghi ima na aka na okpa okuko di n’ime ya.
    33. Ozu si na ya na-anukwanu ihe ogbu-opi na-afu, kama na aja upa ekweghi ya bilie.
    34. Ikpo ukwu na okwute buru chioma , ya akpolam.
    35. Ehi si ugwu, ” a na m ari gi.” Ugwu zaa ya, ” a na m agwu gi ike.”
    36. Ugwu anaghi adi n’ihu ezuo like n’azu.
    37. Nwamba si na ihe o ji abu ya nyuchaa nsi ya ekpochie ya aja bu na o naghi ara ahu ihe mmadu aghoo ihe onye ozo.
    38. O na abu okpoko bere n’ugwu o ha ka enyi.
    39. O na abu onye omekaome lechaa anya ma o hughi ihe a ga-eji naa ya una, o chiri aja gbawa oso.
    40. Onye turu okwute n’ikpo oha mmadu amaghi na onwere ike ituta nwa nna ya.




    0



    0
  5. ỌGBỤGBA OKWE: Uju Nwanekezie 21 , Mazị Ikechukwu Ọjị 6. Hmmmmm!!!! UJU NWANEKEZIE AGHỌỌLA ỌKAIBE ILU hoo!haa!! SITE NA ITURUKWA UGO ỌZỌ, NKE UGBORO ISE YA.
    Ụmụnwoke, akwa ọkụkọ tiwee akị ihere emee nkume




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

2 + 9 =