NWANYỊ

Spread the love

NWANYỊ

7 Comments

  1. 1. Nwanyi siwe egheghi eghe, onye obia echewe alaghi ala.
    2. Ka aka ha nwanyi ka o na-atukwasa di ya.
    3. Ihe mere nwoke alubeghi nwanyi, mere nwanyi alubeghi di.
    4. Nwoke na-alu nwanyi mechiri ahu, o di ka ndi obodo ya a na-aso anu nchi.
    5. Nwanyi makaria di ya n’uzo, ihe chere di ya ewere ya.
    6. Nwanyi choro ighu nwunyeedi ya onu na-asi ya nyetu ya mmanu ka ya were taa akwu.
    7. Nwanyi baa oba, egwu ejide igwe ji.
    8. Nwanyi na-azo ngbala buru uzo zoo di ya.
    9. Nwanyi gbata mma n’ibe, ya nye di ya.
    10. Nwata nwanyi luru di ohuu si, ‘ ihe nke a ekwesighiri ya”. O bu nne ya ka okwesiri?
    11. Nwanyi buru uzo daa isi mkpe na-erere ibe ya ihe.
    12. Onye nwanyi na-afuru oja na-ama okwu arusi.
    13. Uta agaghi ata nwanyi jiri abali muo nwa n’ihi na o bu mgbe ahia jiri tuo ya ka o jiri lota.




    0



    0
  2. 1 Ugwu mụta mgbaji ukwu, agadi nwanyị amụta agakata ezue ike.
    2 Nkwụ ọkah/ogologo daruo ala, nwanyi aria ya elu
    3. Ana ejide egbe na aka tupu ajụwa mp nwanyi aga eri ya

    4 Nwanyị na ete ofe ogiri mara ijiji anya mbịa.
    5 Agadi nwanyị anaghị akaru nka na egwu ọ mara agba.

    6 Agadi nwaanyị nwere onye na elekote ya sị na
    agbụrụ ya adghị aka nka.

    7 Mbe si na agha daa ọ zọgbuọ nwanyi di ime. Agha
    daa ndi nwere ụkwụ azọgbuo nwanyi dị ime, ma kpụrụ mbe.

    8 Nwaanyi muta ite ofe mmiri mmiri, di ya amuta ipi utara aka were suru ofe.

    9 Nwaanyi anaghi-eji na nwunyedi ya
    kwere ya ekene nke oma kpowa ya
    ogo.

    10 Tupu gi na nwayi ajado ayikota, juakwa ihe gburu di ya.

    11. Agadi nwayi kawa nka odika ejighi akụ luọ ya




    0



    0
  3. 14. Eri-ago ekweghi umu nwanyi gbaa afo onu.
    15. O na abu emezitere nwanyi ohuu ebe o na-asa ahu, mmiri ya a na-ada vom vom.
    16. Aga m ekwo na enyi m nwanyi mara mma gaa ria elu ube e doro alusi.
    17. Onye emeghi ka onye ara, umunna ya anaghi alunye ya nwanyi.
    18. Nwanyi obula di ime topuru akwa ma omughi nwa ihere aburu nke ya.
    19. Uzo nwanyi abughi uzo nwa.
    20. O bu nwanyi na-esi ogiri na-ama ijiji anya kporo.
    21. Nwanyi obula muru ejima asaa enweghi ihe mere n’abali obula a ga-akoro ya akoro.
    22. Onye juru nwanyi, ya jukwa ndinako ya.
    23. A kwuru oto tuba nwanyi ime o muo onye ara.
    24. Nwoke luchaa ogu; nwanyi enwere akuko.
    25. Ihe na-agu nwanyi, na-agu onye tubara ya ime.
    26. O na abu nwanyi karia di ya, mgbala ya akaa.
    27. Nwanyi aga si na ya amutaghi nwa mana ahu ya diri ya.
    28. Oke osisi darue ala, nwanyi aria ya elu.
    29. A na-esi na ntupe ogodo ama nwanyi gbara oru.
    30. Nwanyi obe pii-pii jeruru be Dibia ikoro ya ihe na-eme ya; mgbe o puru ya n’otule, “puu” o si Dibia, ” nke a bu ihughi n’anya, I nu ya n’nti.”




    0



    0
  4. 31. Nwanyi gbara oso na be di ya na-abu nlata guba ya, o gaa ikpa nku n’owere di ya.
    32. A na ebu uzo ahu ihu nwanyi muru nwa tupu ajuo ya ihe o muru.
    33. Onye obula luchara olu ewere nwanyi kwuo ya ugwo, eji ya ugwo ma nyekwa ya olu ozo.
    34. Ugwu muta mgbaji ukwu, agadi nwanyi amuta ariikata ezuo ike.
    35. Onye na-eche obibia enyi ya nwanyi na-anu nzo ukwu ndi mmuo.
    36. Onye chegidere enyi ya nwanyi ma o hughi ya, ya rie ihe obula o dobere ya n’ihi na o bu olu ojoo ka ndi mmuo napuru ya.
    37. O na abu ayokata nwanyi ogbu enyi ma ayotaghi ya, egosi ya amu.
    38. Onye na-aturu nwanyi ilu di ka onye ji okpiri aku aturu.
    39. Onye obula nne ji ya na nwanyi bu mkpoonu.
    40. O na abu omumu hiawa ahu, nwoke na-abia nso nwanyi a na-abia.
    41. O na abu nwanyi tofee ilu di, o buru nwunyeedi nne ya.
    42. Ihe eji agakwu nwanyi di ime abughi ka o muo ejima kama o bu ka obi di ya mma.
    43. Nwoke ji nwanyi naabo na-ebukari onu anakpu ura mgbe obula.
    44. Onye obula na amaghi ka nwunye ya ga-adi n’agadi, ya Lee ogo ya nwanyi anya nke oma.
    45. Okokporo na-asi ka a luoro ya nwanyi osooso, o nweburu onye ya na ya bi?
    46. O na abu nwanyi choo ikpari nwanyi aga, osi ya na nwa na-ata ata n’afo.
    47. O buru na mgba aja adadoghi nwanyi ajadu, onaghi ama uru Di bara.
    48. O na abu nwanyi lelia Di ya, ike akpoo ya nku.
    49. Nwanyi si na ikpe ya na Di ya abughi nke mmadu; o bu ndi mmuo ga-ekpere ha ya?
    50. Nwanyi mara ihe bu okpu eze Di ya.




    0



    0
  5. 51. Nwanyi ire oma Di ya anaghi ajuru ya NRI.
    52. Kama mmanwu umu nwanyi, mmanwu apuzina ncha.
    53. O na abu nku koo ajo nwanyi onya uko di ya.
    54. O na abu nwanyi sie ajo nri, o si na o bu nke guru ya.
    55. Onye o bula nwanyi ji n’ugani, ogu Egbe ji ya.
    56. O na abu nwanyi kawa nka o di ka ejighi ego luo ya.
    57. Nwanyi anya ihere na-amugbu nwa.
    58. Okeke nwanyi di nti njo.
    59. Nkita nwanyi zuru na-ata akwa okuko.
    60. Ebe obula o di nwanyi na so luo ya Di, a na-eme ya enyi ebe ahu obi a na-ato ya uto.
    61. Nwanyi obioma na-amu nwa akaghi aka mgbe nile.
    62. Nwanyi mara obi Di ya o di ka ogworo ogwu.
    63. Nwanyi obula Di ya choro ikpo asi apughi isite ya n’ofe di uto.
    64. Nwanyi di ime anaghi ama ochi nwa na-achi n’afo.
    65. Nwanyi uga omumu anaghi ekwe nwa ya arahu ura.
    66. Nwanyi aga si na nwa ma-uma aga ya, n’ihi na ya enweghi ara ilu.
    67. Onye ukpa anaghi ama mgbe o riri aku nwa ada ya nwanyi
    68. O bu naani nwanyi ma nna nwa ya.
    69. O na abu nwanyi tofee ” onye muru”, o torue ” onye na-alu”.
    70. Nwanyi ike ukwu o na-atu egwu, o bughi mmadu ga-alu ya.




    0



    0
  6. 1.Nwanyị na-eke ogiri mara ijiji anya mpịa
    2. Nwanyị chọọ ịchọ nwunye di ya okwu, ọ sị ya nye ya mmanụ ka o were taa akwụ
    3. Anaghị asị nwanyị mụrụ nwa n’ahịa kpachite ụkwụ
    4. Nwoke lụrụ nwanyị ụkwụ gbagọrọ agbagọ ma etu ga si edila
    5. Nwanyị anaghị agba ọgụ nwa na ike dị ya
    6. Mmadụ na-akwa ihe ajọ nwanyi na-akwa
    7. Agadị nwanyị daa nda abụọ, a gụọ ihe o bu n’ụkpa ọnụ
    8. Nwanyị buru ibe ya ụzọ siwe ite na-aka ya enwe mkpọ mkpọ ite
    9. Nwoke anaghị edu onye ka ya mma aga nke enyi ya nwanyị
    10. Onye metere nwatakịrị nwanyị enyi sị ya kparịa ya




    0



    0
  7. 1. Nwoke mụtara ọtụtụ ụmụ nwanyị anaghị ebe akwa ndi ọgọ
    2. Ọ bụghị onye lụọrọ gị nwanyị, ọ kpọnyekwuo gị ute
    3. Nwanyị di ya dara ibi ihe ukwu anaghịkwa atụ ya egwu
    4. nwanyị di ya nwụrụ sị,a na-ekwu ka e si eli di ya si kwukwuo okwu onye ga-akụchi ya
    5. Ịlụ nwanyị abụghị ịnụ ịhe na ntị




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

17 + 14 =