ILU MAKA NNA/NNE

Spread the love

ILU TAA BỤ MAKA NNA /NNE

6 Comments

  1. 11. Nne ewu na-ata agbara, nwa ya a na-ele ya anya n’onu.
    2. Nwa eyighi nne eyighi nna o ga-eyi anu bi n’ohia?
    3. Agwo anaghi atu nwata n’ihu nne ya.
    4. Nwata nwanyi luru di ohuu si, ” ihe nke a ekwesighiri m” o bu nne ya ka okwesiri?.
    5. Agaghi m asi nwata nne ya nwuru ebena akwa n’ihi na obughi m ga-akwara ya nne ya.
    6. Dimkpa o nokwa n’ulo mgbe nne muru awo ma ghara I gbati ya ukwu na aka.
    7. Edi na enwe abughi otu nne muru ha, ihe siwe ike, enwe na edi azawa nwanne ka umu anu ndi ozo nyere ha ohere.
    8. Ogu a abughi ogu nne na-agbara nwa.
    9. Otu nne na-amu ma otu chi anaghi eke.
    10. Onye nna ya ziri ohi na eji ukwu agbawa ibo.




    0



    0
  2. 11. Nwata nna ya na-azutara akpakwuru anu na a abu o hu anu o rowa ya anya.
    12. Nwata na-amu iri elu nne ya a na-amu akwa.
    13. Aka ala na ikpere ala ka nwa ewu ji anu nne ya ara.
    14. Onye osisi gburu nna ya, mkpuru akwukwo dawa, o gbawa oso
    15. Onye atu gburu nna ya anaghi eji mkpi atu anu mmanya
    16. Okpu aja dara n’ala a laruola ikwu nne ya.
    17. O chitara akwa nza na-ekpesa ka oha n’ibu, o buya wegara nne ya n’oke?
    18. Onye ero gburu nne ya gbuo nna ya, o tolite riwe ero, okwa ya ji aka ya waa ili ya
    19. Ebe a na-adu nwa nwere nne odu , onye enweghi nne a na-amuta ihe
    20. Nna m muru m
    21. Nwata obula nne ya na-esi ogiri na ama ijiji anya kporo.
    22. Nwata na-amaracha ka e si ebe akwa, ama buru ozu gafee ama nna ya.
    23. Eriwe eriwe, a chupu nwa enwe nne.
    23. Anuka m uzu anaghi anu olu nne ya n’oma ahia.
    24. Na nwata a na-erika bu ma ya na nne ya na-eri.
    25. Otu o masiri Ada ya maa mma, nna ya agaghi alu ya.
    26. Kitipa na-egburu onye ume- ngwu nne ya.
    27. Onye nna ya na-akpa aturu anaghi atu mkpuru anya obula egwu..
    28. Nwata ya na nna ya na -abu Ede anaghi ama mgbe o kporo nna ya iyi site na isi ya, ” butakwa isi ndi mmuo.
    29. Ike gwu nne ewu o rachaa okwa.
    30. Nwata ga-anwu anwu siri nne ya were odu nri kwere ya onya.




    0



    0
  3. 31. Oma uma anu jury nne ya ma ugboguru o na-amikwa anyu.
    32. Nne wetara ji k oju AFO, nna webilata ya ka o pu echi.
    33. Ebe nwata na ebe akwa aru aka, nne ya anoghi ya, nna ya anoro ya.
    34. Nwata nwere ike iji ara nne ya gwuo egwu, ma o pughi iga na ihe nna ya.
    35. Nwa nza tolite o di ka o ga-aka nne ya.
    36. Nwata ya na nne ya bi anaghi ama nna ndi mmuo na abia n’ulo ha abali obula.
    37. Onye ekweghi ka o ha, e bufee ya ama nna ya.
    38. Nwata nne ya anoghi n’ulo na-esi igbudu eje ahia.
    39. Onye mutara onye ngworo a anaghi atu ya ” ome ka nna ya”
    40. O but nwa okuko ka eji arata nne ya.
    41. Ubochi onye ohi ga-akwa nne ya, ndi niile ihe ha furu agaghi iwerecha ha.
    42. A na m asi nwata biliere m n’oche; o buru na nne ya akpoghi ya, nna ya akpoo ya.
    43. Ebe obula osoro agbogho ya kpuo ara; nne m amuchala nwa.
    44. Onye ma nna ya amarala ndi ichie.
    45. Ihe gburu nne okuko anaghi ekwe umu ya saa anya.
    46. Nwata kwere onya n’ihe nne ya, o maa nna ya.
    47. Nwata anaghi ebu nna ya uzo amuta di-okpara.
    48. Ebini satara mkpi asata; mkpi puru mkpi site n’afo nne ya.
    49. Ka eji nwa mkpi wee ma atu; asi Egbe buru isi nne ya?
    50. Onye obula nne ji ya na nwanyi bu mkpoonu.




    0



    0
  4. 1. onye nne ya anọghịzị anaghị anya ihe anya ihe ahịa
    2. onye nna ya nọ eluigwe anaghị aga ọkụmmụọ
    3. A na-adụ nwa nwere nna ọdụ, nke na enweghị nna a na-amụta ihe
    4. ị maghị na onye ị na-agbara afa na nna ya bụ dibia
    5. ihe ahụghi n’ọhụ nne ewu adịghị mma ịhụ n’ọhụ nwa ya
    6. isi nne ehi daa,ọkụka(ogige ehi ) echie
    7. ogwumagala sịrị na ya agaghị ekwo na ọhịa na-agba ọkụ kwụsị ịga ije ndi ọgaranya nna ya kuziri ya
    8. nwa ewu hulata ala, ọ ṅụọ nne ya ara
    9. adaka hụ nna nwe ubi obi atọọ ya uụtọ




    0



    0
  5. 1. onye nne ya anọghịzị anaghị anya ihe anya ihe ahịa
    2. onye nna ya nọ eluigwe anaghị aga ọkụmmụọ
    3. A na-adụ nwa nwere nna ọdụ, nke na enweghị nna a na-amụta ihe
    4. ị maghị na onye ị na-agbara afa na nna ya bụ dibia
    5. ihe ahụghi n’ọhụ nne ewu adịghị mma ịhụ n’ọhụ nwa ya
    6. isi nne ehi daa,ọkụka(ogige ehi ) echie
    7. ogwumagala sịrị na ya agaghị ekwo na ọhịa na-agba ọkụ kwụsị ịga ije ndi ọgaranya nna ya kuziri ya
    8. nwa ewu hulata ala, ọ ṅụọ nne ya ara
    9. adaka hụ nna nwe ubi obi atọọ ya ụtọ
    10. ebe nwata na ebe akwa arụ aka, nne ya anọghị ya nna ya anọrọ ya




    0



    0
  6. OGBUGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 49, MAZỊ IKECHUKWU ỌJỊ 8. ỌKAIBE ILU ETURUKWALA UGO ỌZỌ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

eight + 12 =