HEI!! ONYE NWỤRỤ ANWỤ NA-AGA IJE!!!

Spread the love


Njinji jiri na Legọs n’isi nso a mgbe otu nwoke onye steeti Ebọnyị akpọrọ aha ya dịka Jemis Okechukwu Uwa dachiri ụzọ ka ọ hụrụ nwunye ya nwụrụ anwụ ka ọ na-aga ije n’Oshodi.

Akụkọ kwuru na Okechukwu gara ịhụ enyi ya nwoke ya na ya rụkọrọ ọrụ n’Aba bizi na Legọs ka onwa Juun afọ a dị n’abalị iri abuọ na asaa. Mgbe nwoke a na-agagharị na ime ogbe Oshodi ka o lere anya hụ nwunye ya nwụrụ anwụ elichagoro n’obodo ha.

Ọ sịrị na nwunye ya nwụrụ n’ihe mberede ụgbọ ala n’ime afọ abụọ gara aga. O kwukwara na ya mechara akwa ya mana ọ tụrụ ya n’anya mgbe ya hụrụ ka ebu ya n’ụgbọ ọgba tim-tim na Legọs.

Ọ sịrị na mbụ, na ya mere ka ya lefuo anya mana ya jisiri ike kpọọ ya aha. Ọ gara n’ihu kwue na mgbe nwanyị a tụgharịrị ma lee ya anya, ihe ọzọ ya hụrụ bụ ikuku.

E kwuru na nwoke bu nwanyị a n’ụgbọ ala ọgba tim-tim koropụrụ ma daa ugbo abụọ ka nkea mere. Mgbe onye ọgba tim-tim a nwetere onwe ya, ọ sịrị na ya na nwanyị a ebiela ọnwa asatọ. Okwukwara n’ọbụ n’ụlọ ụka ka ha matara. Ọ sịrị na ya hụrụ nwanyị a n’anya nke ukwuu ma kwekwa ya nkwa ọlụlụ.

Nwoke ọgba tim-tim a sịrị na nke nwanyị sịrị ya na ọ bụ naanị ya bị ma na-arụkwa ọrụ na Legọs. Ọ gara n’ihu kwue na ya ariọla nwanyị ahụ ka ya soro ya ga hụ ndi ibe ha mana ọ jụrụ jụwaa isi ma na-agwa ya na ndi ibe ha bụ ndi ajọ mmadụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.