NDI ISI ỌCHỊCHỊ ETINYEWELA OKWU ỌNỤ MAKA UDO N’EBỌNYỊ NAKWA KRỌS RIVA

Spread the love


Osote aka na-achị steeti Ebọnyị bụ Dọkịnta Kelechi Igwe nakwa ogbo ya nke steeti Krọs Riva bụ Ọka mmụta Ivara Esu, ezutala mba abụọ ndi ahụ nọ na tigbue zọgbue na steeti abụọ ndi a bụ Ukelle nakwa Izzi maka ikpa udo.

Ọbụ ndi osote ndi ọchịchị a nakwa onye ntụzi aka ikpa oke ala n’ala anyị bụ Mohammad Ahmed soro gaa njem a nke were ọnọdụ na Mfuma dị na ndịda Ukelle na okpuru ọchịchị ime obodo Yala, nke steeti Krọs Riva.

Isi okwu dị na njem a bụ ka aga-esi wechighata udo n’etiti mba abụọ ndi a bụ ndi nọ n’ọgbaghara nke buteworo itufu ọtụtụ ndụ nakwa akụ n’ụba ndi mmadụ n’ebe ahụ.

Ọka mmụta, Esu bụ onye buru ụzọ kwue okwu sịrị na mba nabọ ndi a ebikọla ma lụkọọ di na nwunye ọtụtụ afọ. Ọ kwara arịrị maka ụdị esem okwu nke a dapụtazịrị n’etiti ha, na ntụmade, na nso nso a maka ndọrọ-ndọrọ ala.

O kwuru na-agbanyeghị nke a, na ndi Ukelle na ndi Izzi ka bụkwa ndi agbataobi. Ọ sịrị na ihe ya chọpụtara na mkpesa ya na-enweta na-egosi na kọmishiọn ala anyị na-ahụ maka oke ala mba na ibe ya emeghị ihe ha kwesịrị ime nke bụ ikwu hoohaa, na nke a bụ orubere onye n’etiti mba abụọ ndi a.

Ọ yọrọ ndi kọmishiọn ọke ala a ka ha were ọsọ were ije bịa dozie okere ala mba abụọ ndi a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

14 + three =