NDI FULANI EBUSOGHỊ ANYỊ AGHA – Kelvin Ochinanwata

Spread the love


Ndi obodo Ezi Nze nke dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Udi na steeti Enugwu ekwuela na akụkọ ahụ nke na-efegharị dịka nnụnụ ugbua ma na-ekwu na ndi nchị ehi Fulani biara buso ha agha bụ nanị okpotokpo asị. Ha gwara ọhaneze ka ha lefue anya n’okwu asị ahụ ana-ekwu sị na egwu na ụjọ ji ndi obodo ahụ aka ugbua.

Mgbe onye isi ndi ndu obodo ahụ bụ Sir Kelvin Ochinanwata na-agwa ndi nta akụkọ okwu n’Enugwu, ọ sịrị na akụkọ a bụ asị asị ma bụrụkwa ime ka egwu enweghị isi na ọdụ jide ndi mmadụ.

Ọ sịrị na ndi ọ nọ nkịtị enweghị efe chọchara ihe ha ga eme ha ahụghị, ha were ga bọlite obere nghọtafie ndi obodo ahụ na ndi nchị ehị nwere na ihe dịka otu afọ gara aga ma kesawara ya ndi mmadụ n’ikuku. Ọ sịkwakwara na mgbe nghọtahie ahụ daputara, na ndi kọmitii na-ahụ maka udo na steeti Enugwu gbara mbọ dozie okwu ahụ.

Sir Ochinanwata sịrị na ka ya siri matadobe, na-enweghị ihe dịka egwu dị n’obodo ahụ bụ Ezi Nze ugbua. Ọ sịrị na ka esi were udo dozie ihe gbasara okwu ha na ndi nchị ehi nwere otu afọ gara aga; na onye na-ekesazị akụkọ ahụ ugbua, na-akọ akụkọ gbara ụka.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

one + 9 =