Arụ! Agụụ ịkwa iko butezịrị ụmụakwụkwọ Bauchi ịlụ ọnwe ha

Spread the love

Bauchi: Gọọmentị Bauchi Steeti emechiela ụlọ akwụkwọ Sa’adu Zungur Model Primary and Secondary School, Bauchi, maka na ụmụakwụkwọ ndi nnukwu nọ ebe ahụ na-emezi agbamakwụkwọ n’etiti onwe ha n’ụzọ megidere iwu. Ya bụ, nwata akwụkwọ nwoke na nwata akwụkwọ nwanyị na-eme ọyị ga-aputazị nọrọ n’etiti ụmụakwụkwọ ibe ha gbaa onwe ha akwụkwọ.

Mmechi a, nke metụtakwuru ụlọ akwụkwọ praịmarị dị ebe ahụ sitere na ntụziaka Mazị Nuhu Gidado bụ Osote Aka na-achị steeti ahụ ma bụrụkwa kọmishọna na-ahụ maka agụmakwụkwọ n’ihi ozi Gọọmentị ahụ nwetara banyere ajọ akparamagwa a.

Mazị Gidado, n’ozi nke onye inyeaka ya n’okwu mgbasa ozi bụ Yakubu Adamu tinyere aka kọwara na ihe butere nke a bụ omume ruru inyi karịzịrị akarị ugbua n’etiti ndi ntorọbịa. Ọ kọwakwara na ụlọakwụkwọ ahụ ga- emechigodu wee ruo na Gọọmentị emechaa nnyocha ya.

hoo!haa!! chọpụtara na ya bụ ajọ akparamagwa eteela o ji aga n’ihu, n’agbanyeghị na klaasị ụmụakwụkwọ ndi nwoke na ndi nke nwanyị dị iche iche mana na ọ bụzị na nke meziri n’izu ụka gara aga ka ihe a jiri pụtazie ihe.

Otu nwata akwụkwọ nwoke nọ afọ nke ise (SS2) bụ onye ya na enyi ya nwanyị nọkwa n’ụlọ akwụkwọ ahụ mere mmemme agbam akwụkwọ ha n’ebe ahụ.

Oke ụzụ na mkpọtụ sitere n’ọnụ ụmụakwụkwọ ibe ha, ndi na atụ mmamma n’isi ha mere ka ndi nkuzi gbatazịa ọsọ, were chọpụtazịa na ụmụakwụkwọ ha madụ abụọ na-agba onwe ha akwụkwọ. O dobeghi anya onye na-arụzị ọru dịka ụkọchukwu ndi Alakụba na ya bụ agbamakwụkwọ adigboroja ha na emere onwe ha.

Ụmụakwụkwọ ndi nke nwoke na-akwụ Narị Naịra ise n’isi ndi enyi ha nwanyị ha chọrọ iji “gbaa akwụkwọ”
Ndi klaasị ha na-atụtazi ego iji zụta ihe ntagharị ọnụ (snacks) a ga-eji mee erimeri na ya bụ “agbamakwụkwọ”

hoo!haa!! were na-ajụzị, kedu ka ụmụaka nne na nna ha zigara ụlọakwụkwọ iji baara onwe ha uru ga-esi hapụzị agụmakwụkwọ werezịa akwamiko merezie aka ọrụ nke na ha na-emezi “agbamakwụkwọ” n’etiti onwe ha? Nke a bụkwa n’agbanyeghị etu ụmụ nwanyị ha si ekechisi ihu ha nile, ma ahu ha nile dịka mmọnwụ.
Tụfịakwa! Okeke nwanyị dịkwa ntị njọ

1 Comment

  1. Hmmm, ọ dịkwa egwu. O nweghị ihe anyị agaghị anụ n’oge a.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.