ATỤỌLA MMADỤ ATỌ NGA N’ỌKA MAKA IMEBI NGWA ỌKỤ LATRIK

Spread the love


Mmadụ atọ bụ ndi aka kpara maka ịdọkasị ngwa ọkụ ndi ọrụ Electricity Distribution Company, EEDC, n’aha nkenke ka atụrụ nga n’Ọka n’isi nso a.

Mmadụ atọ ndi a nka ekwuru aha ha dịka Onyedịkachi Nwosu dị afọ iri na asatọ; Chinọnso Ezenwanne dịkwa afọ iri na asatọ, nakwa Chizọba Ezedalụ dị afọ iri abụọ na abụọ dara iwu megidere ụmụ akparama agwa dị añaa dịka ọ dị n’akwụkwọ iwu ala anyị, Act, Cap. M. 17 nke afọ puku abụọ na anọ. N’otu aka ahụ, iwu ha dara megidere nkebi nke 390(9) nke akwụkwọ iwu arụrụmala bụ criminal code nke afọ puku abụọ na anọ.

Onye isi mgbasa ozi ndi EEDC bụ Emeka Eze, kwuru na ọmụma ikpe ndi a bịara n’ime izu ụka ole na ole atukwara ndi ogbo ha bụ Amaechi Joe nakwa Ejike Chidozie nga afọ atọ n’ụlọ ikpe majie dị na okpuru ọchịchị ime obodo mgbago Ọka maka idọsasị ngwa ọrụ ndi EEDC n’Agụlgeri.

Ọ sị na ọbụ onye ikpe majie nke aha ya bụ Chief Magistrate Ọnụnkwọ mara mmadụ abụọ ndi a ikpe

Leave a Reply

Your email address will not be published.

five × 5 =