ILU MAKA ỌKỤ

Spread the love

ILU TAA BỤ MAKA ỌKỤ

19 Comments

  1. 1. Onye ulo ya na-agba oku anaghi achu oke.




    0



    0
  2. 1. A na-esi be ite, aga be egbe oku?
    3. Ozi eziri anwuru oku eruola eligwe aka.
    4. A na-aguru akwu, nke si n’oku a na-eghe.
    5. I choo ihu ochi nkita, I nye ya ji di oku.




    0



    0
  3. 1. Ọ gwara ya ihe ọkụ ji ntị oke eme.

    2. Ọ bụ ọfọ kpatara ọkụ ji ghara ite gbuo ihe dị n’ime ya.

    3. Kama ịta ihe jaa eze, hapụ ya ka o foo ọkụ.
    4. Nwayọ ka e ji aracha ofe dị ọkụ.
    5.Ọkụ ụzụ daa ibube, ọ dị ka ọ nyụrụ anyụ.
    6. Ọkụ dasa gị dasa nwa gị, i buru ụzọ tichapụ nke gị.




    0



    0
  4. 7. A naghị eji iwe oke esu ụlọ ọkụ.




    0



    0
  5. 8. E lelịa nwa ite, ọ gbọnyụọ ọkụ.
    9. Nwata amaghị ihe e sinyere n’ọkụ, uche ihe e sinyere n’ọkụ egbuo ya.




    0



    0
  6. 10. Ozi e ziri anwụrụ ọkụ eruola eluigwe.




    0



    0
  7. 11.Otu mkpụrụ akwụ anaghị efunarị mmadụ n’ọkụ.




    0



    0
  8. 12. Mmadụ anaghị eje be mmụọ gụta ọkụ, ọ pụta na be mmadụ nyụnahụ ya.




    0



    0
  9. 13. Ụkpana na-ere ọkụ sị na ya na-aha mmanụ.




    0



    0
  10. 14. Diochi sinye ite n’ọkụ riwa elu, ma ọ daghị elu, ihe o sinyere n’ite eree ọkụ.




    0



    0
  11. 6. Mba ji na-akari ihu n’oku.
    7. Oku a gunyere nwata na’aka anaghi eregbu ya.
    8. Na oku na oku ka-eji eri ihe onye agwu.
    9. Nwata jide oku jide mma; oku ereghi ya mma e yie ya.
    10. Nwata gbere egbere soo m oku, m there egbere sogwara ya.




    0



    0
  12. 11. Nkita nobu na-anya oku uguru wee puo.
    12. A na-ekwu na oku gbara Dada, I na-aju na o gbara afo onu ya
    13. Onye ulo ya na-agba oku anaghi achu oke.
    14. Oke okwa kwudoro oke ite di oku, ya na osuso na-eme.
    15. Oku anaghi efe iyi agbagbu awo.




    0



    0
  13. 16. Ebe oku nyuru awusa owa.
    17. O nweghi onye si sinyere ya miri n’oku wee riwa elu.
    18. Oku daa iberiibe, nkita a makpuru na ya.
    19. Ogwumagala so na ya agaghi eji maka na oku na-agba ohia hapu ije Chukwu nyere ya.
    20. Oku daa mmiri mma ya aruo.




    0



    0
  14. 21. Onye iwe oku na-ebu onye mere nso ala uzo anwu.
    22. Ulo achoro ikwatu akwatu ka onye ara munyere oku.
    23. Chinchi siri umu ya noro juu na ihe do oku ga-emechaa juo oyi.
    24. Achuba aka IPU n’ulo, oke tunye ego ngwere tunye, n’ihi na oku gbaa ulo, oke aburu oke ohia ngwere aburu ngwere ikpa.
    25. Oku gbagburu mbe kpu okpu igwe, o hu nwa okuko bu nani owara o ga-emere ya ebere?




    0



    0
  15. 26. Ihe mere oku jiri hapu ite gbuo ihe di n’ime ite bu maka na nsopuru dibara gboo.
    27. O na abu nnukwu ite siri n’oku umu ogbenye agagbuo onwe ha na ozi.
    28. O na abu okenye mechie anya onyuo mamiri oku.
    29. Onye isi nkwocha anaghi eje nzuko oku.
    30. Onye iwe oku anaghi eri ekpe.




    0



    0
  16. 31. O adighi mma iji iwe dughudu wee kpoo yoghoyo oku.
    32. Udele gwara umu ya na anu di nka a na-eri ya n’oku n’oku.
    33. Ikenga adighi ire akpoo ya oku.
    34. O na abu nkita erighi una o nyara oku.
    35. Ururu si kama isi ya ga-akwu anwuru oku na o ka mma ochi-chiri n’uzo ya na Dinta siri gbaa oso.




    0



    0
  17. 36. O buru na onwu egbuchughi agadi nwanyi, agadi nwoke aghaghi I so ya nya oku uguru.
    37. Ikpo nkume anaghi agba oku
    38. Onna abu agadi nwanyi garuo ebe oku gbara ala nke oma, o di ya ka afo saba ya.
    39. O na abu mbu ree n’oku, aguru abo na-egheghi eghe.
    40. A naghi agwa ahu oku na nku adighi.




    0



    0
  18. 1. ọkụ daa ibube, ọ dị ka ọ nyụrụ anyụ
    2. e jighi iwe oke esu ụlọ ọkụ
    3. ọ bụ adimnamma mere ọkụ jiri hapụ ite gbuo ihe nọ ya n’ime
    4. onye ọkụ hụrụ na-atụ ibiribe ọkụ egwu
    5. e siwe ụzọ ite abuọ n’ọkụ nwa nkịta agbagbuo onwe ya n’ọsọ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

one × four =