OTU ỤKỌCHUKWU KATỌLIK AWỤỌLA NDI ỤKA YA N’ALA

Spread the love


Otu ụkọchukwu ndi ụka Katọlik amara nke ọma dịka Egwu Ụmụ mụọ emela ka achọpụta na ihe ọtụtụ ndi otu Kraist na-eme ugbu a bụ ‘ekwere m n’ọnụ mana ekweghị m n’obi.’

Ụkọchukwu a bụ onye ọrụ na dayọsisi nke Nnewi di na steeti Anambara, aha ya bụ Tadeus Ilechukwu kere ekike dika ọnye ara ma bịa kwụrụ n’ọnụ ụzọ ụka ebe ọ na-eme ekpere, iji mara ma ndi ụka ya, ha ghọtakwara nkuzi gbasara ‘ihe ọbụla i mere otu onye n’ime ụmụnnam…’

Ọtụtụ n’ime ndi ụka ya ahụ gafere ya ma lefue anya, ụfọdụ chụrụ ya ọsọ ebe ọ bụ sọnsọ mmadụ ole na ole (mmadụ ise) lesara ya anya nye ya obere ego. Naanị otu onye nyere ya nri n’ọnụ.

Mgbe ụkọchukwu a bụ nwa amala Ọkịja na steeti Anambara mere ka ndi ụka ya mata ihe gara, ọtụtụ bere nnukwu akwa.

Ka ọ dị kita, ana-ekesa ihe onyonyoo vido nwa amadi a n’ọba ozi ikuku di iche iche.

Oge ikpeazụ, ọtụtụ ga-akwa mmakwara.

Leave a Reply

Your email address will not be published.