NDI NTỌ AHAPỤLA ỤKỌCHUKWU NDI KATỌLIK ATỌRỌ NA NSUDE

Spread the love

Ndi uwe ojii nke steeti Enugu azọpụtala ụkọchukwku ahụ ndi ntọ tọrọ na Nsude dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Udi n’isi nso a, na-anataghị ego ọbụla.

Ụkọchukwu a bụ Rev. Fada Udengwu ka ndi amakekwu tọọrọ n’abalị anọ nke ọnwa a anyị nọ n’ime ya bụ Julai ka ọ na-eme mwe-mwe ọsọ nke isu ụtụtụ.

Ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii na steeti Enugwe bụ Ebere Amaraizu kwuru na onweghị mmerụ ahụ ọbụla mere ụkọchukwu a.

Ọbụ n’ime oke ọhịa dị n’agbata Udi na Ọzalla ka ndi uwe ojii jiri anya ọkụ chọwa ndi ntọ ji ụkọchukwu a, ma napụta ha bụ agụ ihe ha kpụ n’ọnụ.

Na mbụ ndi ntọ a sịrị na-aga akwụ ha otu naarị nde naira tupu ha-ahapụ ụkọchukwu a, mana mgbe ha hụrụ na ihe ka nte bịakwutere nte n’ọnụ, ha hapụrụ ụkọchukwu a rie mbọ mbọ ọsọ.

Ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii na steeti Enugwu bụ Ebere Amaraizu kwuru na-amalitela ịma imi n’ala maka ịmara ka mmiri siri baa n’opi ụgbọgọrọ maka ọtụtọ atọrọ ụkọchukwu a. Okwukwara na aka akparala otu onye ana-ama imi maka inyere ndi uwe ojii aka na ṅịmata ka eke siri nyaa anwụ maka yabụ ụkọchukwu atọrọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

eighteen − 1 =