NDI NTỌ ATỌRỌKWALA ỤKỌCHUKWU NDI KATỌLIK

Spread the love


Ndi ntọ ji egbe, amabeghị ndi ha bụ atọrọla ụkọchukwu ụka katọlik na steeti Enugwu n’ụbọchị Satọdee gara aga. Ọbụ mgbe ụkọchukwu a na-eme mwe-mwe ọsọ nke isi ụtụtụ maka inyere ndụ aka n’okporo ụzọ si Nsude gawa Obiọma dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Udi ka a tọrọ nwoke a.

Ọbụ ụkọchukwu na-enyere onye isi ụkọchukwu nke ụlọ ụka Senti Makị Nsude aka ka atọọrọ.

Ka ọdị ugbua, ndi ntọọ a na-ekwu na aga enye ha otu naarị nde naira tupu na ha ahapụ yabụ ụkọchukwu.

Onye bishọp nke Dayọsisi Enugwu bụ Kalịstus Ọnaga ayọla ndi ntọ a ka ha hapụkwa ụkọchukwu ahụ n’efụ n’ihi na ụka ya enweghị ụdị ego ahụ.

Mgbe akpọtụrụ ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii n’Enugwu, bụ Ebere Amaraizu, ọ sịrị, éé, na atọọrọ ụkọchukwu a n’eziokwu ma kwukwa na ha bụ ndi uwe ojii karịrị okwu a.

Anyị ga-echeta na n’izu ụka gara aga ka a nọrọ n’ otu ogologo ụzọ ahụ tọrọ nwa amadị bụ Maikel Obi bụ nna onye isi ndi otu egwu bọl bụ Mikel Obi. Ndi uwe ojii mechara zọpụta nwoke a n’ime ọhia, n’agbata Egede n’Afa dị n’okpuru ọchịchị ime obodo udi.

Leave a Reply

Your email address will not be published.