AKWA(CRY)/ AKWA (CLOTH)/AKWA(EGG)

Spread the love

AKWA(CRY)/ AKWA (CLOTH)/AKWA(EGG)

8 Comments

  1. 1. Nkita nwanyi zuru na-ata akwa.
    2. O ma akwa asa ahu mara onwe ya.




    0



    0
  2. 3. Akwa okuko bu oku, nke ogazi buru ihe oriri.
    4. Ajo okuko na-akpata ihe a na- eji esi akwa ya.
    5. Nwata bee nne ya, bee nna ya ihe o ga-ebe n’ akwa agwula.




    0



    0
  3. 6. Akwa okuko tipia aki, ihere aburu nke nkume.
    7. Asi nwata ebena akwa, si enyela ya nri?
    8. Anwu ututu akoghi akwa, o bu nke mgbede ga-ako ya.
    9. Agaghi m asi nwata nne ya nwuru ebena akwa, n’ihi na o bughi m ga-akwara ya nne ya.
    10. Akoba ka-esiri gbaa azi, oburu akwa nri.




    0



    0
  4. 11. Ahu ozu anya ebewe akwa.
    12. Ihe eji ebere ibi akwa bu na ebe odi no n’nkpa, maa a ma na o kaghi Ihe isi na-ebu.
    13. Mmanu metu n’oche, metukwa n’akwa anaghi ama be a ga-asi onye obia ya were oche.
    14. Ebe nwata na-ebe akwa aru aka, nne ya anoghi ya nna ya ga anoriri ya.
    15. Nwata na-amu iri elu, nne ya a na-amu akwa.




    0



    0
  5. 16. Nwata na-ebe akwa na e nyeghi ya akiilu, o hukwara ka ihu ndi tara ya di.
    17. O chitara akwa nza na-ekpesa ka oha n’ibu, o bu ya wegara nne ya n’oke.
    18. Onye ma akwa okwa na-achita ya.
    19. O kwesiri ka mmuo e jiri akwa okuko churu aka marakwa n’aka na okpa okuko do n’akwa ahu.
    20. Okuko gbakerichaa ala, o yie otu mkpuru akwa.




    0



    0
  6. 21. Nwanyi obula di ime topuru akwa ma o mughi nwa, ihere aburu nke ya.
    22. Mbekwu huru osimiri na-awakwa akwa, o ga-awu awu ka o ga-efe efe.
    23. Nkita usa na-ezo ezo ata akwa okuko.
    24. Onye a na-eyiri akwa nwuda bu onye ama, onye ulo obula maara ebe APA digasi ibe ya n’ahu.
    25. Ka ebu mmanu aso akwa ocha ka eyi akwa ocha aso mmanu.




    0



    0
  7. 26. O na abu onye bu uzo mara ezigbo akwa, ajuju egbuo ndi kpe azu.
    27. O na abu onye chi ojoo chowa nwanyi o ga-alu, ogirisi a mara akwa na-acho di.
    28. Onye nwanne ya tiri Ihe ma uma ebe akwa.
    29. Uwa bu ndi na ochi; ndi n’akwa.
    30. Ajo mkpotu anaghi anu uzu akwa.




    0



    0
  8. 31. Akwa okuko juru nkata, onye ma nke oke ma o bu nke bu nwunye.
    32. Okuko obula ga abu oke ga-ebido na akwa..
    33. O na abu agadi nwanyi zuta akwa ohuu, o gaa ikpe a na-akpoghi ya.
    34. Onye yiri akwa nkirika, agwa ya nkirika okwu.
    35. O na abu atoo nti n’ala anu akwa agbusi.
    36. A nu na Dike nwuru , ndi ochi a ka ndi akwa.
    37. Akwa ngwere na-etiwa na onwe ya.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

11 − five =