NDI NCHỊ EHI EGOSILA ỊTỤ N’ANYA HA NA MKPEBI NDI ỌDỊDA-ỌWỤWA ANYANWỤ

Spread the love

Otu jikọrọ ndi nchị ehi Fulani akpọrọ Miyetti Allah Cattle Breeders Association of Nigeria (MACBAN), ngalaba nke Ọdịda-Ọwụwa anyanwụ Naijiria, egosila ịtụ n’anya ha gbasara mkpebi ahụ ndi aka na-achị steeti ise dị na mpaghara Ọdịda-Ọwụwa anyanwụ nọrọ kwue na ha ekwetaghị ka ehi ha na-ata nri ka o si masị ha na mpaghara ahụ.

Onye ndu ndi otu ahụ bụ Alaaji Gidado Siddiki, n’ozi o weputara n’Ọka, ụbọchị Tọsdee, kwuru na ụdị mkpebi a tụrụ ha n’anya, n’ihi na ha na ndi steeti ise dị na mpaghara ahụ na-aghọta onwe ha nke ọma.

Ndi otu a sịrị na ha agaghị echefu na ndi aka na-achị steeti ise ndi a na-enye ha ezigbo nchekwa, ebe ha na-agba mbọ ihụ na ehi ha anaghị emebi ihe akọrọ n’ugbo ndi mpaghara ahụ.

Alaaji Saddiki kwuru na mbọ ha na-agba ịhụ n’udo na-achị n’etiti ha na ndi mpaghara Ọdịda-Ọwụwa anyanwụ na-amita ezigbo mkpụrụ.

Ọ sị n’ọbụ nkea mere ojiri gbagwojuo ha anya bụ mkpebi a nke ndi aka na-achị mpaghara ahụ nwere, ma kwue na ọ bụrụ na etinye mkpebi ha n’ọrụ, na nke a, nwere ike imebiri ha aka ọrụ ha ma wete ọnọdụ ama onye bụ onye n’etiti ha na ndi mpaghara ahụ…

Ọ bụ n’ime abalị ole na ole gara aga ka ndi aka na-achị Ọdịda-Ọwụwa anyanwụ nọrọ n’Enugu kwue na ha agaghị ekwe ka ndi nchị ehi hapụ ehi ha ka ha na-akpa nri ka o si masị ha na mpagharị ahụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.