NWIKORỌBỊA EBERELA UTU ONYE UWE OJII

Spread the love

<img src="http://www.hoohaa.com.ng/wp-content/uploads/2018/07/knife_blood_splash-300×123.jpg" alt="" width="300" height="123" class="alignnone size-medium wp-image-1942" /
Otu onye uwe ojii ji ọkwa nspektọ ka nwikorọbịa dị afọ iri na atọ bepụrụ utu ya na steeti Katsina mgbe ọ chọrọ idina ya na obodo Tudu Markabu di n'okpuru ọchịchị ime obodo Faskari.

Mgbe otu onye achọghị ka-akpọọ aha ya gwara ndi nta akụkọ okwu gbasara ihe a, ọ sịrị na ejiri udị akparama agwa mba Sodom a mara onye uwe ojii a. O wee kwue na ebe ọ bụ na ọchọ ihe ukwu aghaghị ịnyara agba enyi, na ọ dịka ọbụ ụka akpara akpa ka nwikorọbị a jiri isi kwee site na iji iwe were mma chabiri odogwu ọzara onye uwe ojii a.

Akụkọ kwuru na esiri na okpuru ọchịchị ime obodo Sabuwar ziga nwoke a Kankara tupu ọ gawa Faskari bụ ebe ọ nọ were anya ya hụ ntị ya n'ụbọchị Tusdee gara aga.

N'okwu ya, ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii nke steeti Katsina bụ Gambo Isa siri na akụkọ a bịara ha n'ụdị ịtụ n'anya na mgbawa obi. Ọ sịrị na ha atụghị anya na ndi ọrụ ha ga na-akpa ụdị ajọ agwa dị otu a.

Gambo gara n'ihu kwue na nwa amadị a nọ n'ụlọ ọgwụ dị na Faskari bụ ebe aga-esi ziga ya ụlọ ọgwụ nke Katsina.

Ọ sịrị na ndi uwe ojii ka na-eleba anya ịmara ka mmiri siri soro akụ oyibo rịa elu. Ọ sị na mgbe nwoke a dịchara mma, na aga agba mbọ inwete ihe akaebe gbasara okwu a. Ọ sị, na ọ bụrụ na nwoke a dara iwu a n'ezi okwu, na aga-ata ya ahụhụ kwesịrị ya ma wegakwa ya n'ụlọ ikpe.

Leave a Reply

Your email address will not be published.