50 Comments

  1. Anu laa taa, echi bu nta.




    0



    0
  2. Agu riaba ahu, umu anu akpaghariba n’ohia.




    0



    0
  3. Anu di n’ohia bu Mma aboghi ya, ijiji erie ya.




    0



    0
  4. Anu gafee mmiri, o fechaa odu ya.




    0



    0
  5. 1. Anụ gbaa ajọọ ọsọ, agbaa ya ajọ egbe.
    2. Beta anụ beta anụ bụ na ahụ nnama




    0



    0
  6. ijiji na-eso anu, aguu anaghi agu ya.




    0



    0
  7. Anu siri n”oku, nkita aju ura.




    0



    0
  8. Anu bu uzo na anu mmiri oma.




    0



    0
  9. 3. Anụ nile baa n’ọkụ amara nke kacha gbaa abụba.
    4. Anụ nile dị n’ọhịa ma enwere eke nwee ọhịa




    0



    0
  10. Ama ka otoro agba nne ehi, anu ya ga-ejuriri nkata.




    0



    0
  11. onwu na egbu Nwa nkita adighi ekwe ya anu isi nsi.




    0



    0
  12. Anu egburu egbu adighi aso mboka.




    0



    0
  13. ugwo e ji akpukpo anu bu ihu ya n’oku




    0



    0
  14. O nwere ihe a na ewepu na anu tupu eribe ya




    0



    0
  15. 5. Onye sị na ya anaghị ata anụ nkịta, ya hapụ mmiri ofe ya.
    6. Agụ n’eme mkpọtụ anaghị egbu anụ.
    7. Mmeju anụ agụ abụghị ihe nkịta chekwubelụ ịta




    0



    0
  16. 8. Anụ kpọrọ nkụ n’eju ọnụ




    0



    0
  17. 9. Okenye chọọ iri anụ oke, ya ejiri eze kere ya ụmụaka




    0



    0
  18. 10. Nwata rie awọ, ọ jụ anụ
    11. Ezuo ka áhá eri anụ udele, atụtuo ngịga
    12. Kama anụ mụ matara n’ọnya ga-atagbum, ya gbalaga
    13. Anụ nwe mpi nwe mpi, ebee ka ebule ñụta mpi
    14. Anụ tagburu nkịta siri ike
    15. Onye anaghị ata anụ ejiri chụọ aja, arakwala mmiri ya.
    16. Etofee ka áhà gbaa nta, etokwuru ka áhà eri anụ.




    0



    0
  19. 17. Nwata anụ juru aka, n’eji nku aka achụ nkịta.
    18. Anụ ekweghị ọtụta, ekweghị olulo.
    19. Anụ nwa mkpi akarịka ihe ana ahụ n’ọkụ.
    20. Ikpurikpu dị na anụ bụ anụ
    21. Anụ enweghị ọdụdụ, enweghị mma.
    22. Ire bụ anụ onye ọbụla kpụ n’ọnụ, ma onweghị onye nke ya kwere ọtịta.
    23. Anụ n’adịghị mma ka-ana ebejuru nwa ogbenye nkata.
    24. Anaghị enye nkịta anụ ka odebe.
    25. Nwata n’ajụ ese nri, ọnaghị ajụ ese anụ.
    26. Ógwú sị na ya na-anọ n’ụlọ ya egbu anụ.




    0



    0
  20. ikpuru di na anu bu anu.




    0



    0
  21. E jighi oso achu nkakwu Maka na o bu anu isi.




    0



    0
  22. 27. Agụrụ anaghị egbu ọta anụ.
    28. Esinye anụ n’ọkụ ụzọ abụọ, njemje egbuo nwa nkịta.
    29. Onweghị anụ na-amakwasị enwe mmiri n’isi.
    30. Mmadụ anaghị abụ nwata na anụ ogburu.
    31. Enye nwata anụ karịrị ya, ọjụọ sị enyere ya nye onye.
    32. Onye nna ya na-azụ atụrụ kwesịrị ita anụ ebule.
    33. Anụ ekweghị ogbugbu, ekweghị ọbụbọ
    34. Nkịta anaghị ahapụ anụ tawa ọkpụkpụ.
    35. Anụ dabara n’ime olulo gburu onwe ya.
    36. Onye ndidi n’eri anụ ọkpọọ.
    37. Onye uche abụọ anaghị egbu anụ.
    38. Onye bịara oge ewepụtara anụ n’ite, amaghị ahụhụ atara sie ya.
    39. Anụ n’enweghị ọdụdụ, Chi ya n’egburu ya ijiji.
    40. Ihe dị ebe azụ dị ebe anụ.
    41. Udele na egbe anaghị azọ nri, udele n’eri ozu, egbe n’eri anụ.
    42. Anụ ka nte mara na ọnya nte.
    43. Anụ nganga mpi anaghị agbo n’ite.
    44. Agbamie nta agbami, erie anụ gbara abụba
    45. Onye gburu ehi jụ ịnye ụmụnna ya anụ, ọchọrọ ka ndi ole tuo ya ogbu ehi.




    0



    0
  23. Anu gburu agu, ebule ekwesighi igakwu ya ogu




    0



    0
  24. ise ka e ji eri anu rere ure




    0



    0
  25. 46. Nwa oke amamihe sị nwanna ya buru ya ụzọ gbuo anụ ka ya mara ka ọ g’esi kenya ya anụ mqka ụbọchị nke ya.
    47. Onye kpụrụ uche ịkpọ ụmụnna ya oriri, ga-akpụkwa ụche anụ ha ga-ata.
    48. Anụ abụghị anụ na-akwazekarị ọnya.
    49. Anụ fere nkọlọ,ọzọ agụba.
    50. Asikwarị na udele bụ anụ oriri, ndi gboo gara erichapụ ya.
    51. Onye n’agba ka anụ, n’egbu anụ.
    52. Anụ ana-agba egbe ọ n’ata nri dị mma itụ egwu.
    53. Ana azọdị ozu mbe, anụ ha añaa ka-aga abọta n’ime ya?
    54. Onye anụ ényi eruteghị aka, ọ sị na ọdị ike karịa nkume.
    55. Anụ ji eze arị elu ma osisi n’elu ilu.
    56. Nwata kpụ anụ n’ọnụ rahụ ụra sị oke taa ya arụ n’ọnụ.
    57. Onye chọrọ ịnwa agadị nwanyị n’enye ya anụ ényi.
    58. Anụ anaghị ajụru njọ na imeju.
    59. Anụ ọbụla kpaba na ngwuru ya ka nsogbu hapụ ịdị.
    60. Iji anụ n’aka, abụghị ọtịta ya.
    61. Ọnwụ egbula okenye ka ụmụaka mara na udele abụghị anụ oriri
    62. Nwata kpụta uche ị ga mmemme, ọkpụta uche anụ.
    63. Onye nara nwata anụ ya, o nye ya azụ.
    64. Anụ enyere mbe anaghị akọ ya akọ n’aka.




    0



    0
  26. Anu gbaa ajo oso, a gbaa ya ajo egbe




    0



    0
  27. okuko nti ike na -anu ihe n’ime ite ofe.




    0



    0
  28. umuaka ma uma egwu egwu aja, o bu ndi okenye nwe anu.




    0



    0
  29. onye huru onu anu na anuri ojidere anu noo na ime ya?




    0



    0
  30. 1. O bu aka na-egbu anu, mma a na-abo.
    2. Nwata na-ata anu eze ya na-agba obara, o bu ya na-ata anu ka o bu anu na-ata ya?
    3. Ugbo abuo ka a na-egbu anu wee tinye ya n’ngiga.




    0



    0
  31. 4. O na abu ngwere tugbuo anu n’ogu ya eloo ya.
    5. Onye obula riri anu udele eriela arusi.
    6. O na abu akpaa akpa gaa nta, egbuo anu a maara aha ya.




    0



    0
  32. 7. Akwa okuko bu oku, nke ogazi bu anu.
    8. O na abu anu ghee, mmiri anu aputa.
    9. Ijiji obula so anu anaghi ebu onu.
    10. O bury na udele bu anu, umuazi akaghi ima the o bu.




    0



    0
  33. 11. Anu ebu nwa.
    12. O na abu ahukaria nwata n’odu anu, ekenye ya utu Obodo.
    13. Okuko so na n’ihe obi ejighi adi ya mma ebe a na-anacha okwa bu maka na abuba anu niile bu out.




    0



    0
  34. 1. Nwata cheta mmemme,o cheta anụ
    2. Anụ kwoo enwe ọ majie aka
    3. Ijido anụ n’aka abụghị ọtịta ya
    4. Anụ nwanyị gburu anaghị agba ọbara
    5. Onye wọrọ nwata anụ ga-enye ya azụ




    0



    0
  35. 14. Okwesiri ka ejide anu egbe n’aka tupu ajuba ma nwanyi o na-eri ya.
    15. Udele abughi any.
    16. Nwata anaghi abu nwata na Anu o gburu.
    17. Kama anu di n’onu ga-atagbu m, ya so n’upi puo.
    18. Anu enweghi eze ekwesighi itagbu nkita.
    19. Anu ozo anaghi eri ibe ya ewepu ikpukpa.
    20. Anaghi esibe anu nkita wee na-arahu ura.




    0



    0
  36. 21. E kwee onya ma o maghi anu, mmadu o ga-etinye aka ya?
    22. Akpa nya azu anaghi ama na ibe ya nyakwazi anu.
    23. Nkita tie anu rie azu agaghi agbanye ya mmanya.
    24. O na-adi mma ka a noro n’ulo kechaa anu agu tupu e jewe nta ; maka na a gbatuo agu, ogu adaa.
    25. Anu nkita doro ora; mmiri ya a doro.




    0



    0
  37. 26. Udele gwara umu ya na anu di nka na a na-eri ya n’oku n’oku.
    27. Anaghi ata anu nshiko na nzuzo.
    28. Anu erighi ibe ya, o gaghi ebu.
    29. O bu anu anegbubeghi ka a na-amaghi ka esi abo.
    30. O na abu nwata rie awo , o ju anu.




    0



    0
  38. 31. Isi anu anaghi efu n’ite ofe.
    32. Onye ketara okpa mgbada n’oke ejighi anu.
    33. Onye eze di ka ya taa nkume ka e nyere anu okpoo juo ya ma a ga-abanyere ya ya n’mmiri.
    34. Nshiko so na ihe ya ji karisia anu niile by na ya na-anu ihe ndi mmuo na-ekwu.
    35. E kutuo okwa, okwa e kutuo anu nganinga.




    0



    0
  39. 36. Onye ketara ukwu onye amu ibi ji anu.
    37. A na-egbu mbe edobe ora, onwere mkpamkpa anu di na anu mbe?
    38. A macha na anu di uto were ya nye ohu ka o side.
    39. Anana ana abona abo; o ga-ata anu na ndu?
    40. Achuba nta so kpoo aha anu a na-achu , ka nkakwu ghara igbagbu onwe ya na oso.




    0



    0
  40. 41. Onwu egbuchula okenye ka umuazi ghara igbu udele kpoo ya anu.
    42. Anya na-ele anu anaghi ele ihe ozo.
    43. Anu zoro ezo baa n’obu; ya zorokwa ezo puta.
    44. Udara bu nke enwe; anu ndi ozo biara nche.
    45. Onwere ihe a na-ewepu n’anu were eri ya.




    0



    0
  41. 46. O na abu eriwo anu; e were azu kwuo ugwo.
    47. Ogaranya gara MBA anu jury akpa, bu ndi o na-enye nyekwara ya.
    48. Onye ohi okuko si , I kwusi ohi okuko bu ma anu okuko o kwusiri ito uto.
    49. Okuko na-akpaghari ma na o maghi na ekechala anu ya.
    50. Nwata ma uma agu egwu aja, okenye new anu.




    0



    0
  42. 51. Nwaologbo siri na anu ya churu oso ma o gbaghi na ya agaghi eri ya.
    52. Nwata nna ya na-azutara akpakwuru anu na abu o hu ibi o riowa ya anya.
    55. N’ezie, anu niile na-afu opi ma nke nkapi na-apu iche.
    54. Nwata anu juru aka na-eji nkuaka achu nkita.
    55. Nkita rimara utu anu; o hu onye dara ibi , o na-egbu odu fini fini.




    0



    0
  43. 56. Nwoke na-alu nwanyi mechiri ahu , o di ka ndi Obodo ya a na-aso anu nchi.
    57. Nkita siri na o by anu huru ya gbaba oso ka ya na-achu.
    58. Mmadu tachara anu tochie okpukpu ya uzo, o maa ya, keduzi uru o bars?
    59. Kama anu m na-achu ga-agbanahu m , egbubirim ya odu.
    60. I chowa anya anu, I gaa ‘isi ya.




    0



    0
  44. 61. Ihe afo huru ya saa ehi e gbuo ya, anu ya ga-eju ukpa, ma o buru ewu e gbuo ya agaghi ahu anu ya anya.
    62. Egbe soro udele kpaa uri, e nwere ike I nwuru egbe n’aka , chupu udele ka o puo n’ihi na anaghi eri anu ya eri ma ya fodu itu abuba ya n’isi..
    63. Edi na enwe abughi otu nne muru ha, ma ihe siwe ike, enwe na Edi azawa nwanne ka umu anu ndi ozo nyere ha ohere.




    0



    0
  45. 64. Anu nwere uche anaghi ekwu okwu ma enyi kwuchie uzo.
    65. Any dina n’ala dina n’akpukpo ya.
    66. A na m ezo ezo agba nwa atani egbe, o bu oke anu?
    67. Anu ogwu ma n’onya, e were okpiri tigbuo ya.
    68. Anu o bula gbara oso ka oke, nwaologbo aria ya elu.




    0



    0
  46. 69. Nwa eyighi nne eyighi nna o ga-eyi anu bi n’ohia?
    70. Anu na-anaghi agbara nkita oso abughi anu oriri..
    71. Anu ikpikpa ka ya na nwanne ya kwu, anu a na-agu ya.
    72. A na-achu anu, a na-agbawuri ya egbe.




    0



    0
  47. 73. Agaghi m asi ka m hata anu no n”uju, si ka aka taa m, ka o wee banye.
    74. Aturu so na o na abu ya na-eleru anya ala, umu anu ibe ya asi na ya di nzuzu.




    0



    0
  48. 1. nkịta sị, sị eboo ya na ya tara anụ ma sị ebola ya na ya rachara ose
    2. ọnwụ egbula okenye ka ụmụaka mara na udele abụghị anụ oriri
    3. anụ soro enwe, ọ majie aka
    4. anụ nwayị gburu anaghị agba ọbara
    5. A chụpụchaa anụ ọhịa ajụwazịa ọkụkọ o gara ebee




    0



    0
  49. ỌGBỤGBA OKWE: DỌKỊNTA ACHỤKỌ 52, UJU NWANEKEZIE 51, IFEỌMA ỌRABASỊLỊ 18,MAZI IKECHUKWU ỌJỊ 4. DON EZEJI 0. ANAGHỊ AGỤNYE ILU A TỤRỤ OGE ELEKERE IRI ABỤỌ NKE ABALỊ GAFERE.

    CHAỊ! ASỌMMPI ỤNYAHỤ KAJARA AKAJA!! DỌKỊNTA NNAMDỊ ACHỤKỌ ETURUWO UGO!!!!!




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.