15 Comments

  1. 1. A na-ekwu na akpa ezughi dibia, ofeke anyara ano.
    2. Onye na-enyo isi ya a na aputa.
    3. Ka ahutachaa mere ngbo ji tuo enwe n’isi.
    4. Oke soro ngwere maa mmiri, okoo ngwere o ga-akokwa oke?




    0



    0
  2. 5. Anu obula gbara oso ka oke, nwaologbo ari ya elu.
    6. Ocho ihe ukwu anyarala agba enyi.
    7. Oghotachara ihe ukpaka miri na-eji isi ekele ala.
    8. Onye na-agho nke ya a na-efu.
    9. Ajugbughi ajugbu eri, bu arighi aria anwu.
    10. Anwu ututu akoghi akwa, o bu nke mgbede ga-ako ya?




    0



    0
  3. Sylvester Nwokedi
    1.Mmadu buru ozu enyi n’isi were ukwu na-akpa abuzu

    2. Agwo na ihe oloro adorola

    3. Nwata bulie nna ya elu,ogodo ayochie ya anya

    4. Nwata erughi eru walu ogodo, Ikuku kuo, obulu ya bulu ogodo ya




    0



    0
  4. 11. Ijiji na anaghi anu ndumodu na-eso ozu abanye n’ili.
    12. Eke etoghi eto na-aro odu ya bu ajo ihe.
    13. Aka zuo abuo n’oku, o buru ubu nri.
    14. Agbara aki fee oke, o buru aru.
    15. Onye noro ebe o no, ebe onoghi a na-agu ya.




    0



    0
  5. 16. Otu aka anaghi eke ngwugwu.
    17. O na abu achuwa abuo, otu alaa.
    18. Anu nza oha aghaa e ji akpa ya mkpa-akpa?
    19. O na abu nwata nyowe omimi ike ya,is I akpoo ya n’ala.
    20. O na abu onye erughi ka Eze o si so lie ya ka Eze?




    0



    0
  6. 21. O ji oso agbakwu ogu anaghi na ogu bu onwu.
    22. Okuko kwesiri ituru ka eko ya, ka agba ghara iwa ya.
    23. A gaghi m eji ka m hata anu no n’uju, si ka aka m taa m, ka o wee banye.
    24. A naghi ano n’ukwu ukwa aghota ube, I mee etu anu, ukwa adagbuo gi.
    25. A gochie oji nti, umu mmuo aju ya.




    0



    0
  7. 26. Ekwekwana ka ughere nari gi agba gi.
    27. Ebe nwata na-ebute ozu nchi ka a na-ebute ozu ya.
    28. Ijuta isi nkita, I ga-eji agba ya mee gini?
    29. Ihe ahu okuko huru malie elu chee na o bu ukpala a bughi ukpala.
    30. Isi okwu abughi mmadu ilo mkpuru utu,ebe o koro di bu inyu ya anyu.




    0



    0
  8. 31. Kama anu m na-achu ga agbanahu m, e gbubiri m ya odudu.
    32. Kpara akwu kpara akwu, onye ebukwala ogbe ya.
    33. Kama usu m jidere ga-atagbu m, a hapu m ya ofelaga.
    34. Mmadu anaghi anyu nsi n’ohia ka ya elu.
    35. Nwata hide oku jide mma, oku ereghi ya, mma eyie ya.




    0



    0
  9. 36. O chitara akwa nza na-ekpesa ka oha n’ibu, o bu ya wegara mne ya n’oke?
    37. Onye chowa onye na-eme ka ya, naani ya ebiri.




    0



    0
  10. 1. onye jiri enyi gbaa ọnya keduzi ihe ọ ga-amata?
    2. ebe nwata jere pata ejula, o jee ya ọzọ ọ pata ikpo nsị
    3. onye ji ọsọ amịcha aka ya, ọ mịchachaa ya ọ ga-afawa ya n’elu




    0



    0
  11. 38. Onye bu nwanne awo zolata ya afo; onye bu nwanne nkapi belata ya onu.
    39. O na abu ekwe onye nchichi n’aka ibi oma aguwa ya.
    40. A na anyu ahuru anyu, mana o dighi mma iji ike egbu oja.
    41. A ma uma eri mbe? O bukwa akpiri mgbawa.
    42. A chuba ehi zogbuo mmadu, okwu mmadu e bughara okwu ehi.
    43. O na abu ota aki nyara uyoro nkume, eleghasiwa ya anya.
    44. A na asi na oria ezughi oke, ndi dara ibi ana eto afo.
    45. Oghotachara ka ube miri anaghi esi ebe o siri rigoro elu aritu.




    0



    0
  12. Author

    1 “Ọ bụrụ na nwadibịa akpachaghị anya oge ọ na-achọ ihe dị n’elu, ọ dabaa na olulu dị n’ala.”

    2 Okokporo chiwe nkwụ, siwe ite, otu emebie.

    3 Ọ bụrụ na akwụ chaa ka ojukwu, o rebie ọnụ.

    4 Ọnụ ụtọ sịrị na ya gbube nwaànyị na ya anaghị e mere ya ebere.

    5 E buru ozu nwa mgbada bawa ọhịa ebe nile nne ya duuru ya ga kpaa nri, ozu ya anọrọ n’isi ree ure.




    0



    0
  13. 46. E buru egwu buru, egwu echughii uche echue.
    47. Gini ka mmadu ga-enweta n’ike oku, ose ga-eji fugbuo ya.
    48. Ebe nwata na-ebutekari ogbe ukwa ka a na-ebute isi ya.
    49. Mkpata akpatachaghi aku, nricha erichaghi ya.
    50. O na abu a kokata oko amu, o ghoo ibi.
    50.




    0



    0
  14. 51. E buru ozu kpaghariba ka esi mara ya, ozu erekaa n’isi.
    52. Eriwe ma afo ejughi by ajo NRI.
    53. Ka as Nwadiala, ” bia dara ogwu” asi ya ” bia buru ite ogwu laa”?
    54. O na abu agochie ofo nti, ndi mmuo adighizi anu ya.
    55. Onye richara nri si na ojughi ya , o makwa na onwere ndi bu onu.
    56. ” Ka m turu, ka m turu” anaghi ama na utaba bu ego.
    57. Onye huru igwurube ma o kpoghi umunna ya, ndi nke lara ohia, onye nwe ha.
    58. Buru rikodo bu anya ukwu.
    59. A gbara aki fee oke, o buru mmiwa ohu.
    60. Gbara gbara ka ewu na-anyu, o nyuo kwururu o buru afo osisa.




    0



    0
  15. ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 49, NNAEMEKA IBE 5, MAZỊ SYLVESTER NWOKEDỊ 3,MAZỊ IKECHUKWU ỌJỊ 3.
    UJU NWANEKEZIE ETURUWO UGO, NNAEMEKA IBE BỤ ONYE NKE ABỤỌ EBE MAZỊ SYLVESTER NWOKEDỊ BỤ ONYE NKE ATỌ




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.