11 Comments

  1. 1. Ewu na-akpa n’ụkwa amaghị na ụkwa na-etigbu ewu
    2. Ewu dina n’ala dina n’akpụkpọ ahụ ya
    3. A na-eji ehihie achọ ewu ojii…..
    4. Nwa ewu hulata ala ọ nụọ nne ya ara
    5. Ewu na anaghị ata hi sowe nke na-ata ji o bido tawa ji




    0



    0
  2. 1. Akugbuo nwa ewu ahu onye nwe ya.
    2. Osusoo na-esu ewu kama aji ekweghi ka ahu ya.
    3. Ewu obula oha na-enye nri na-anwukari na aguu.
    4. Ewu obula nwuru n’oba ji abughi aguu gburu ya.
    5. O na-abu ewu tiwaa ite, o nyara akiriko eju n’olu.




    1



    0
  3. 6. Ewu ataa m igu n’isi.
    7. Okenye anaghi ano n’ulo ewu a muo n’ ogbu.
    8. Ogbo nri ewu anaghi agbo ubochi onye nwe ewu ga-abia.
    9. Ihe aturu jiri ka ewu ogologo di ya n’odu.
    10. Mmuo gbanu gbanu na-eri ewu akpikpa nri.




    0



    0
  4. 11. Ike gwu nne ewu, orachawa okwa.
    12. Mgbe ma mgbe okuko jiri mara the, a gunye ya na ewu.
    13. Okuko anaghi ericha nsi, eze eree ewu.
    14. Mkpi nkugowe anaghi agba ewu.
    15. O na abu etowe nwa ewu ya asojie ukwu ya.




    0



    0
  5. 16. Nne ewu na-ata agbara, umu ya a na-ele ya anya n’onu.
    17. O na-agbo ihe ewu na+eri.
    18. Anaghi enye ewu ji ka o debe.
    19. Ejighi abali acho ewu ojii.
    20. Ewu na -anyire odu ya, o si na ya na -emegbu onye nwe ya.




    0



    0
  6. 21. Ewu richaa ihe onye ubi, ya efee oke ala.
    22. Ewu rie ji ngwere na-ekwe n’isi, ewu erighi ji ngwere na-ekwe n’isi.
    23. Ihe AFO huru saa ehi e gbuo ya, any ya ga-eju ukpa, ma o bury ewu e gbuo ya agaghi ahu anu ya.
    24. Ka e jiri ewu ma atu, asi agu buru ya?
    25. Nwa ewu ga-egbu ikpere na Abu n’ala tupu o nuta nne ya ara.
    26. Onye bu igu ka ewu na-eso.




    0



    0
  7. 27. Onye nwe ogodo ewu na-ata?
    28. Ihe anahughi n’ike nne ewu, ekwesighi ihu ya n’ike nwa ya.
    29. Gbara gbara ka ewu na anyu; o nyuo kwururu oburu otoro.
    30. O bu nani onye bi n’ulo mara ada nne ewu.
    31. O dighi mma n’nti inu na ” ewu tara nshiko.”




    0



    0
  8. 1 si were ututu chuba ewu oji

    2 Were ewu manye na ogbu nacwere ogbu manye ewu ka bu otu ihe

    3 Nkakwụ gbara ahọ abụrụla mkpi mmuọ

    4 mkpụghari ka eji ere nwa mkpi

    5 Ewu sị na ya na nkịta ga-akpa ụrị ehihie marakwa na ọ ga-eji n×i me nri ehihie!

    6 Ewu nwuru na oba ji abughi agu gburu ya

    7 ewu si na e buru egwu bịa n’ama nna ya , ya amaghị agba ya awuliwe elu

    8 Mkpi mbugobe adighi agba ewu

    9 Odighi mma Nkita racha nxi eze ere ewu.

    10 Onye rieri Ewu eji chuo aja ji agbara ugwọ

    11 ọkwa nụ mmadụ nwe ọgọdọ ewu n’ata

    12 Onye anu ewu erughi si n’ọ na ato aja aja

    13 Chi agbọghọ ewu mere ka a kpụpụ ya ahịa

    14 Nne ewu na agba afọ ọnụ chi ya na eke ya iche

    15 ewu anaghị amụta atụrụ

    16 Enye ewu ogologo odudu o ga efichapu kpakpando

    17 Ewu si na ya gachara ikwu nne ya wee muta isoliwe onu elu

    18 Ewu taa ma ibe ya ataghi o bu atuta ojo.

    19Nani ewu onwu na agu na akpo agu oriri

    20 Ọ bughi ihe na amasi ewu na amasi atụrụ

    21 Agbanyeghi ka nwa mkpi si mee ihu ya, o gaghi igbochi onye nwe ya idokpuru ya a ga ahia.

    22 Ewu na ji anaghi anoko n’ofe ebe.

    23 Nne ewu si ka-ya gbaa a gbaa buru n’afo maka onwu nwamkpi

    24 Onye okwu ya kwu-ọtọ, bụ ya gboro ihe ewu na-ata.

    25 Ejighi ukọ ukwa aka n×i ewu




    0



    0
  9. 25 Ejighi ukọ ukwa ata n×i ewu




    0



    0
  10. *10 . Mmuo gbanu gbanu na-eri ewu akipikpa nti.




    0



    0
  11. ỌGBỤGBA OKWE:UJU NWANEKEZIE 26, NNAEMEKA IBE 19, MAZI IKECHUKWU ỌJỊ 5




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.