ONYE FULANI NA-EKWUSA OZI ỌMA KRAIST.

Spread the love


Onwere ihe onyonyoo (vido) nke na-agagharị n’ikuku ugbu a, bụ ebe otu onye amala Fulani na-agbasa ozi ọma banyere Jesu Kristi.

N’okwu Chukwu ya, nwoke a na-ezi ozi ọma banyere Jizọs bụ onye ọ sịrị na ya kwenyere na ya dịka otu ụzọ mmadụ pụrụ isi n’ime ya wee nwee nzọpụta.

Ọ sịrị na ozi ọma ya na-agbasa bụ dịka esiri dee ya n’akwụkwọ nsọ ya bụ “baible” dịka esiri were asụsụ Fulani dee ya.

Otu onye dere ihe banyere nwoke a n’ọba ozi fesibuk ma bụrụkwa onye kwuru na ya ji anya ya hụ nwoke a, dere sị, “keduzị ihe anyị ji maka ya alụ ọgụ?”

Nwoke a aha ya bụ Daniel Okpe, bi na steeti Kaduna gara n’ihu dee, “ọ bụ Kraist bụ onye nwe mmadụ niile, ebe mụ ji anya m hụ ebe nwoke Fulani a na-ekwusa ụdị ozi ọma dị etu a, ndi ndọrọ-ndọrọ ọchịchị hapụ nụ anyị ka anyị biri n’udo”

Leave a Reply

Your email address will not be published.