AMAALA NDI GBURU ỤKỌCHUKWU NA BENUE IKPE ỌNWỤ

Spread the love


Ụlọ ikpe ukwu anọrọla na Makọdị bụ isi steeti Benue maa madụ abụọ bụ ndi gburu ụkọchukwku Jọn Adeyi ikpe ọnwụ.
Aga-akwụgbu ha akwụgbu.

Mgbe ndi ezi n’ụlọ ụkọchukwu ahụ nụrụ ka-esi kee ikpe ọnwụ a, ha kwuru na ọbụ ikpe mkwụmọtọ ka ụlọ ikpe a kere.

Ọbụ ụnyahụ bụ abali iri abụọ na ise ka amara ndi gburu ụkọchukwu ahụ ikpe ọnwụ ha na Makọdị.

Ndi ezi n’ụlọ ụkọchukwu a gara n’ihu kwue na ebe ha na-eto ndi niile gbara mbọ ịhụ na ikpe nkwụmọtọ a were ọnọdụ, na ha na-ahụta”ụbọchị taa dịka ụbọchị nnukwu nwute maka na o mere ka ha chetakwa ihe mgbawa obi bụ ogbugbu ahụ egburu ọdị ha n’obi bụ Jon Adeyi bụ onye ji nzere mmụta Dọkịnta.”

Ha kwuru na etu o sina dị, n’ọbụ ihe nkasi obi na ndi arụrụmala gburu ụkọchukwu a na-anata ụgwọ dịrị ajọ aka ọrụ ha.

Ha kpere ekpere ka Chineke nye yabụ ụkọchukwu ezumike.

Ndi oji egbe, tọọrọ ụkọchukwu Jọn n’afọ puku abụọ na iri na isii, ka ọ dịsịrị nwa obere oge, ahụrụ ozu ya n’ime ugbo dịdebere Ọtụkpa.

Ụkọchukwu Jọn bụ onye na-ekwu ma Bishọp anpghị nso na Dayọsis nke Ọtụkpo ma bụrụkwa onye nlekọta nke ụlọ ụka Katọlik nke Okpoga.

Ndi uwe ojii mechara nwude ndi tọọrọ ụkọchukwu a ka ọ gasịrị nwa obere oge. Ọ bụ ọnye ji ọkwa “Assistant Commissioner of Police” bụ Abba Kyarị duru ndi uwe ojii a n’ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.