NDI OMEBE IWU AHỤLA IHE ANYỊ JIRI JỤ BỤHARỊ… Ụmụ ntorọbịa Igbo

Spread the love


Ụmụ ntorọbịa ndi Igbo kpọrọ onwe ha ‘Igbo Youth Movement’ ekwuela na ọbị dị ha mma ugbu a ndi ụlọ omebe iwu Naijiria hụrụ ihe ndi Igbo jiri jụ kpam kpam, ibinyere onye isi ala bụ Muhammadu Buhari aka na nhọpụta nke afọ puku abụọ na iri na ise.

Ndi otu ụmụ ntorọbia a agwala ụmụ Naijiria ka ha rịọ ndi Igbo mgbaghara maka emu ha kwara ndi Igbo maka na ha ekweghị ịkwụnyere Buhari n’afọ 2015, n’ihi na ihe na-eme ugbu a, egosila na ihe ha bụ okenye nọ n’oche hụ, na ndi ọzọ kwụ ọtọ ahụghị ya.

Okwu ndi a dị n’akwụkwọ ndi otu a weputara n’Enugwu ụnyahụ nke ọbụ onye chọpụtara otu a bụ onye ozi-ọma Eliọt Ugochukwu-Uko binyere aka n’ime ya.

Ozi a kwuru na a ga-arịọrịrị ndi Ọdịda-Ọwụwa Anyanwụ Naijiria arịrịọ maka nnukwu amamihe ha nke mere ha ji kwụrụ n’ebe ha kwụ na nhọpụta nke afọ puku abụp na iri na ise.

Ha sịrị na ndi niile kwara ndi Igbo emu nweziri ike iji anya ha gbara onwe ha ekeresimesi site ka ndi omebe iwu sizị agbapụta n’otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ha nọbụ, agbaga otu ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ kịta.

Ha sị hoohaa, na ndi Igbo gosiri na ha mara nke ka mma n’afọ 2015. Ha kwuru na ka afọ ahụ gasịrị na ihe ejiri kwụọ ụmụ Naijiria ụgwọ nhọpụta ha mere bụ ịkpọchị ụlọ ndi ọka-iwu na nke ndi omebe iwu nakwa ihe ndi ọzọ dị njọ dịka ndi a.

Ha sịrị na kịta, na anya asaala ụmụ Naijiria ha were chọpụta na emu akwara ndi Igbo, were na-ekwu na ha kponyere ákwá ha niile n’otu nkata abụghị eziokwu.

N’ikpe azụ ha sịrị n’ugbua, ndi omebe iwu na-agbakwuruzi otu nkata ahụ ụmụ Igbo kponyere akwa ha n’afọ puku abụọ na iri na ise.

Leave a Reply

Your email address will not be published.