Ilu maka Ehi

Spread the love

Asọmmpi Ilu nke taa bụ maka EHI Chetakwanụ Iwu Asọmmpi Ilu hoo!haa!! 1. Asọmmpi na ebido n’elekere iri na otu nke ụtụtụ kwụsị n’elekere iri na abuọ nke abali 2, Onye atụla nke ibe ya tụrụ

16 Comments

  1. Author

    1 Ehi na enweghi odudu chi ya na achuru ya ijiji

    2 Ihe Ehi hụrụ gbalaba ọsọ,ka ọkụkụ hụrụ na-atụ ọnụ.

    3 Mmiri riri Ehi ka Mbe hụrụ na-awa ọgọdọ. Ọ ga efe mmiri a efe ka ọ ga awụ ya awụ?

    4 Beta anụ,beta anụ bụkwanụ n’ahụ Ehi.

    5 Nganga ka okenye ji agbara ehi oso

    6 Okuko nwa ogbenye bu ehi ya

    7 Ehi arachala m aka maka onweghi nnu m paa na aka m

    8 Onye ụgwọ ehi bịa, onye ụgwọ ọkụkọ alaa

    9 Kama ehim m ga agbalahi m, egbubirim ya odu

    10 Onweghi ka afo asaka ehi oghoro ewu

    11 Ama ka ehi atana ahu, ije ngara di ya na ahu.

    12 Ehi si na o na anyuka, ya nyujuo nkata ka anyi hụ

    13 Mgbada nyuọ ka ehi, ike awaa ya

    14 E liwe uzo liwe ehi, m a horo uzo hara ehi maka ehi bu so anu, eriwe ya ericha ya mana uzo bu i gawa ya o naghi echi-echi.

    15 Agbanyeghi otu afo si saa ehi, o ga ejuriri nkata ma egbue ya.




    0



    0
  2. 2. Kama ehi m ga-agbanahu m, egbubiri m ya odudu.
    3. Ehi oha new na-arahu na agu.
    4. Ihe afo huru ya saa ehi e gbuo ya, any ya ga-eju ukpa, ma o buru ewu e gbuo ya agaghi ahu anu ya.
    5. I chowa ijide oke ehi, chowa oke mmadu.
    6. Na mpi ga a na-ejide oke ehi.




    0



    0
  3. 7. Kpoto kpoto a gbala n’ihu ehi.
    8. Mmuo nara nwa ogbenye ehi a choghi ya ndu.




    0



    0
  4. Author

    16 Madu anaghi e buru ehi n’isi ma na achu nta oke.

    17 Eliwa oke ehi, eliwa oke mmadu. Oke ehi tibe udoh oke mmadu ejide ya

    18 Udoh anaghi aso ehi anya

    19 Ama ka ehi aranah otua ime so ofu nwa

    20 Ehi akariala anu a na-ahu n’oku




    0



    0
  5. 8. O na abu ehi gwufee mmiri ofechaa odu ya.
    9. Ehi so na chukwu mere ya ihe oma wee nye ya okpu igwe.
    10. A chuba ehi zogbuo mmadu, okwu mmadu e bughara okwu ehi.
    11. Ihe o masiri otoro gbaa nne ehi, anu ya ga-ejuriri ukpa.
    12. A naghi ekechi ehi na-azocha oka onu.




    0



    0
  6. 13. O na abu oke ehi dobie, oke mmadu achuba ya.
    14. Anaghi egbu ehi asaa were aza Ogbuehi.
    15. Mbe si na iji Ehi wee kwa nna ya di mma , kama na ya enweghi ego ehi.
    16. Oke ehi daa uzu atuo.




    0



    0
  7. 17. Ehi si ugwu, ” a na m ari gi”. Ugwu zaa si ya, ” a na m agwu gi oke”.
    18. Ogbenye adighi ata anya Ehi.




    0



    0
  8. 19. O na abu obere onye gbuo Ehi, mpara echie ogbo.
    20. Onye a work anu Ehi na-akpo ya ” Nchigbinchi”.
    21. Ehi na-enweghi odu, chi ya na-egburu ya ijiji.




    0



    0
  9. (1) Isi ehi anaghị agbọ n’ite




    0



    0
  10. (2) Ehi anaghị eme nkụja




    0



    0
  11. 22. Ihe o soro nwa Ehi ya buo n’ibu, o ga-esekpuru ala tupu onuo nne ya ara.
    23. O masi gi gbuere Egbe Ehi, anya ga-adiriri ya na nwa uriom okuko.




    0



    0
  12. Author

    21 Anaghi acho isi efi acho na ite

    22 Isi nwoke bụ isi Ehi ọ naghi agbọ n’ite

    23 Ọ bụghị ụkwụ a ka NAMA ga-eji ru ụmụahịa




    0



    0
  13. * 3. Ehi oha nwe na-arahu na abu.
    24. Hei! Ehi a e buo.
    25. E nyibe oke ehi e nyibe oke mbuba, oke ehi tibie mbuba achuba ya nwude.
    26. Onye a na-achu ehi ebeku; o jighi ogbu ya o jide ogwu ya.
    27. E jighi na nsi e buka ama nsi ehi.
    28. Kedu ihe I na-enere m ka ehi huru mmanwu?
    29. Okenye ji aghugho a gbara ehi oso.




    0



    0
  14. * 20. Onye a woro anu Ehi na-akpo ya ” Nchighinchi’.
    30. Ehi ga-azogburiri onye o ji.
    31. Mmiri a maa Ehi n’anya.




    0



    0
  15. ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 23, NNAEMEKA IBE 20, DỌKỊNTA ACHỤKỌ 1




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.