ARỤ NA-EME, LEKWANỤ ONYE CHỌRỌ ILI NNE YA NA NDỤ!!!

Spread the love


Ndi uwe ojii mba Kenya anwụchiela otu nwoke dị afọ iri anọ, mgbe ọ na esi ọnwụ ile nne ya na ndụ. Nwoke a nke aha ya bụ Chris Wamalwa bụ onye mpaghara Kabuchai.

Ọ bụ mgbe ndi na-agafe n’ụzọ malitere nụba mkpu nne nwoke a na-eti maka enyem aka nke nzọpụta, ka a matara ihe na-aga. Mgbe ndi mmadụ gbabatara n’ebe nwanyị a na-eti mkpu ka kpọrọkpọtọ gbara n’ihu ehi. Ọbụ n’ime olulu mkposi aka na-egwu egwu ka ọ chọrọ inubanye nne mụrụ ya ma kpochie ya aja.

Mgbe ọ na-akọ ihe butere ihe aka nwa enwe ji dịka aka mmadụ ka nwanyị a jigoro anya ya hụ ọnwụ bụ Beatrice sịrị na nwa ya ahụ chọrọ ka ya were ala ya resịrị ndi mmadụ nye ya dịka ihe nketa.

Beatrice sịrị na ya bụ nwanyị ajadu, ma kwue na ọbụ ala ahụ ya rere bụ naanị nchekube ya ka nwere iji gbalahụ ụbịam igbu ya.

Nwanyị a bụ Beatrice sịrị na ya rere ala ahụ maka iji nyere onwe ya aka, mana mgbe nwa ya nụrụ nke a, ọ gbara ọsọ gbalata ka enye ya ego eretere n’ala ahụ. Ọ sịrị na ọbụ n’ihi na nwa ya enweteghṅ ihe ọ chọrọ ka o jiri chọọ ili ya na ndụ. Nwanyị a kwukwara na ya adịlarị na mbụ zụtara nwa ya otu obosara ala na nwa obere obodo dị ha nso.

Otu onye okenye ogbe ahụ aha ya bụ Ronald Umbu kwuru na-akpụgala nwoke a bụ Chris n’aka ndu uwe ojii.

Leave a Reply

Your email address will not be published.