20 Comments

  1. 1. Ọnọdụ ugo adịghị egbe mma
    2. Nwata erughi ịgba ele gbaa ele, ele a wụọ ya wụọ egbe ya
    3. E nwere ihe dị iche n’egbe n’egbe




    0



    0
  2. 1. Égbé bere ugo bere, nke sị ibe ya ebekwala, nku kwaa ya.
    2. Égbè ejiri gbaghuo ahịa adịghị mma mgbajọ




    0



    0
  3. 3. Anụ gbaa ajọ ọsọ, agbaa ya ajọ égbè




    0



    0
  4. 4. Ka ahụ n’anya ka mgbọ égbè jiri tụọ enwe n’isi.




    0



    0
  5. 5. Ụzụ na-amaghị akpụ ogene, lee égbé anya n’ọdụ.
    6. Anaghị eji égbè agbagbu nwa nza.




    0



    0
  6. 1. A na ebu uzo jide anu egbe na aka tupu ajuo ma nwanyi a na-eri ya.
    2. A na-achu anu, a na-agbuwuiri ya egbe.
    3. A na-eburu uzo chupu egbe, tupu a doo umu uriom aka na nti banyere iwughari n’ohia.
    4. A na m ezo ezo aba nwa atani egbe, o by oke anu?
    5. Egbe soro udele kpaa uri, enwere like nwuru egbe n’aka, chupu udele ka o puo n’ihi na anaghi eri anu ya eri ma ya fodu itu abuba ya n’isi.




    0



    0
  7. 6. Egbe na-erughari okuko na umu ya a na-ezo onwe ha.
    7. Egbe laa ije, umu okuko emegharia ahu.
    8. Egbe na-efe, o hu osisi di ya mma o bere.
    9. Egbe na-erughari n’ elu, umu uriom a chiri ume n’aka.
    10. Egbe na+efe n’elu, nnyogo ya a na-aga n’ala.




    0



    0
  8. 7. Ọkụkọ na-erubeghị na ubu akpọ chọrọchọrọ, égbé n’ebughị ya, ufu eburu ya.




    0



    0
  9. 11. Egbe odu nka abughizi nwa egbe.
    12. Egbe si uzu ya mana ugoloma na-agara onwe ya, onye tupuru ya onu?
    13. Egbe gara mba ewerela isi ya tuo mgbere.
    14. Ihe egbe huru gbawa oso ka oso, okuko ekwesoghi ihu ya kwuru.
    15. Kama egbe ga-ahapu nwa okuko, isi ya ato n’akirika.




    0



    0
  10. 1. NWA EGBE NA-AGBASA ODU KA UDELE, O GA-EMEKWA IHE UDELE NA-EME?




    0



    0
  11. 16. Nnunu juru elu n’ala, jukwa n’ohia n’uzo naani aha nnunu nwata mara by egbe.
    17. Okuko hu ihe yiri egbe, o jiri gboo zowa umu ya.
    18. Okuko kpahie uzo , egbe e buru ya.




    0



    0
  12. 2 Ihe egbe riri lara ugo n’afo.
    3. Egbe na udele adighi azo nri, udele n’eri ozu ma egbe na ebu nke di ndu.

    4 Egbe bere Ugo bere,nke sị ibe ya ebela,nku kwaa ya

    5 Nwasa (bird) na-aga ebe egbe n’ebu ya. (A bad remark).

    6 Agaghim alo uwa okuko, ka egbe hapu iburum.

    7 Egbe buru Nwa ugbala, ugbala ekwughi okwu; oburu Nwa okuko, okuko bee kwa kwa, malie matuo..ya mere egbe ji ebu okuko n’ihi n’osiri na nkita na-agbo uja adighi ata ata

    8 Ije nwokuku na-aga adighi egbe obi mma.

    9 Egbe amaghi okuku onye uwa (nwogbenye).

    10 Egbe buru ọlaa

    11 Ebe ana agba ubi oku ka-ana ahu egbe.

    12 Okuko ocha gosiri onwe ya Egbe




    0



    0
  13. 13 Egbe anaghi ebu nwa udele

    14 onwere ihe diche n’egbe n’egbe

    15 Egbe gbuo nku, a mara ebe o ga ebe




    0



    0
  14. 1. Ebe a hụrụ anwụrụ ọkụ, a hụ egbe
    2. Egbe gbuo nku, a mara ebe ọ ga-ebe
    3.




    0



    0
  15. 19. Ka e ji Nwamkpi wee ma atu, asi Egbe buru isi nne ya.
    20. Uchicha burugodu nnu Egbe, o pughi I ga ogu na be okuko.
    21. Egbe na okuko anaghi azu otu ahia.
    22. Egbe anaghi ebute ihe di ya n’okoro.
    23. Onye gbachara Egbe wee malite it I mkpu, o bu olu ya kariri olu egbe?
    24. Okenye adighi mma iko n’ulo ma ” o hu Egbe “.




    0



    0
  16. 25. Dinta obula gbachara Egbe daa n’ala apuola ma Dimkpa.
    26. O na abu okuko tuhie, Egbe eburu ya.
    27. Onye obula nwanyi ji n’ugani, ogu Egbe ji ya.
    28. Nnunu nwata mara aha ya bu Egbe.
    29. Eburu egbe sochasia uzo niile Ngwere siri ri elu, nsi egbe agwu.
    30. O bu njerita ka Egbe ji enwu oku.
    31. Egbe bulite Ugo a natuo ya bu ajo ihe.




    0



    0
  17. 32. Ihe obula Egbe muru aghaghi ibu okuko.
    33. Nri niile Egbe riri laara Ugo n’ahu.




    0



    0
  18. 34. A na-agba onye isi Egbe, chi ya a na-ezere ya mgbo.
    35. Oji Egbe agba ojoko chetakwa na ugani na-abia.
    36. O na abu Eze nwere Egbe, ogbenye enwere igu.
    37. Onye gbara mmadu Egbe adighi mma igho ya mgbo.
    38. O mask GI gbuere Egbe Ehi,anya ya ga-adiriri na nwa uriom okuko.
    39. Oji Egbe o ga-eji gbagbu Udele, ya gbagbuo kpalakwukwu.




    0



    0
  19. 40. A ga m eji maka na m huru Egbe n’elu wee hapu Nza m ji n’aka?




    0



    0
  20. ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 40, DỌKỊNTA NNAMDỊ ACHỤKỌ 7, NNAEMEKA IBE 15, MAZỊ IKECHUKWU BISMARCK ỌJỊ 5




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.