IHE MBEREDE OKPORO ỤZỌ EGBUOLA ỤKỌCHUKWU NDI KATỌLIK

Spread the love

Ụlọ akwụkwọ mahadum ndi ụka katọlik dị na Nneochi na steeti Abịa, akpọrọ Spiritan University, bara na nnukwu iru uju ụbọchị Faraidee gara aga maka ọnwụ otu onye n’ime ha bụ Rev. Fr. Cosmas Agụọcha.

Nwoke a ji ụgbọala mahadum a aga mgbe ọ gbakpuru n’okpuru otu nnukwu ụgbọala gwongworo kwụrụ onwe ya, ka ọ fọrọ nwa obere ka o rue njikọ ụzọ akpọrọ brewery junction Awo-ọmamma nke steeti Imo.

Ihe mberede a enyeghị ya ohere chaa chaa n’ihi na ọnwụrụ ozugbo ozugbo ahụ.

Ka ọdị kịta, eburula ozu nwa-amadị a buga n’ulọ ọba ozu. Amalitela atụmatụ maka olili ozu ya.

2 Comments

  1. Ka mkpụrụobi ya zuru ike na ndokwa, amen. Mana nwa amadị ahụ ka na-akwado ichi ụkọchukwu, ọ bụbeghị Fada.




    0



    0
  2. Ka Chineke nara mkpuru obi ya na ndokwa. Amin.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.