NDI ỤKA NGLIKAN EWELA NDI FULANI ATỌ N’ỌRỤ ỊGBASA OZIỌMA

Spread the love

Ndi ụka Nglikan, dayọsis nke mgbago ugwu Enugwu (Enugu North Diocese), ewela ndi Fulani mmadụ atọ n’ọrụ ịgbasa oziọma nke Kraist nye ndi nchị ehi nọ n’okpuru ọchịchị ime obodo ndi a: Ezeagụ, Udi na mgbago ugwu Enugwu (Enugu North) nke steeti Enugwu.

Bishọp nke ndi dayọsis ahụ bụ Sọstenis Eze kwukwara na yabụ dayọsis ewubela ndi ọbụ ọrụ ha igbasa oziọma nye ndi Fulani na ndi Awụsa. Ọ sịrị na onye nchịkọta ndi a bụ nwa afọ Igbo bitegoro aka ma rụtekwa ọrụ aka n’ugwu-awụsa bụ Kanọn Nnaji.

Mgbe ọ na-ekwu okwu na ọgbakọ sinọd nke atọ ndi dayọsisi ahụ nwere n’ụlọ ụka nke Pita dị Asọ n’Okwojo Ngwoo na steeti Enugwu, bishọp a kọwara na ọ dị mkpa ime nke a, ka ewere belata tigbue zọgbue na-adapụta n’etiti ndi ọrụ ugbo na ndi nchị ehi na steeti ahụ, ọkachakwa mkpa ka o si gbasata ndi bi n’akụkụ ebe ndi a akpọrọ aha. Okwuru na akụkụ ndi a na-enweta nkwabata ndi nche ehi na gbanyụụ.

Bishọp Eze yọrọ onye Achịbishọp na-ahụ maka mpaghara Nglika ahụ bụ Achịbishọp Ịmanuel Chukwuma, ka ndi ụka leba anya na ụzọ pụrụ iche maka atụmatụ ịgbasara ndị nchị ehi Fulani oziọma Kraist

N’okwu ya, “n’ihi ka ndi Fulani si enubatazị n’igwe, ha amanyela ụkwụ n’akụkụ niile dị n’ebe a. Anyị agaghị ahapụ ha etu a, ya mere anyị ji tụpụta atụmatụ nke anyị kpọrọ ịzọnye ụkwụ n’ịgbasara ndi Awụsa na ndi Fulani oziọma Kraist. Anyị malitere site na ikpọ otu onye n’ime ụmụ nne anyị bitegoro aka na mgbago ugwu ala anyị bụ Kanọn Danan Nnaji ka ọ gbadata maka ọrụ a.

Leave a Reply

Your email address will not be published.