AGA-AKWUGBU NDI UWE OJII ANỌ NA STEETI AKWA IBOM

Spread the love

A maala ndi uwe ojii mmadụ anọ ikpe ọnwụ n’Uyo nke steeti Akwa Ibom maka na ha gbagburu onye ji ọgba tim tim ebu ndi njem nke a na-akpọ onye ọkada. Aga-akwụgbu ha akwụgbu.

Aha ndi a bụ: Mosis Akpaete ji ọkwa nspetọ, Idoko Samsịn, jikwa ọkwa nspetọ, Enobong Udo ji ọkwa kọpra nakwa Godịwin Nnanna jikwa ọkwa kọpra. Mmadụ anọ ndi a na-arụ ọrụ na ngalaba ‘C Divusion’ na steeti ahụ.

Onye isi ndi kpere ndi a ikpe bụ nnukwu ọkaikpe Ifiok Ukana mara ha ikpe maka ịtịkọ isi ọnụ gbaa ajọ izu bụ nke ha jiri gbuo nwa-amadị a ana-akpọ Felis Akpan bụ onye Ibiakpan n’okpuru ọchịchị ime obodo Ibiono Ibom nke steeti Akwa Ibom. Ọ sị na ebe onye gburu ọchụ na ọchụ ga-eso, na-aga akwụgbu ndi a akwụgbu.

Ọ bụ ka ọnwa iri n’afọ puku abụọ na isii dị n’abalị iri na isii ka ndi uwe ojii mmadụ anọ ndi a gbagburu nwoke ọgba tim tim a, na njikọ okporo ụzọ Abak na ụzọ isi ụlọ ọrụ ukwu ala anyị bụ ‘Federal Secretariat’; n’ihi na o kweghị ịkwụsịrị ndi uwe ojii a, nọ na nche ngagharị, mgbe ha hụrụ ya n’ebe amachiri ndi ọgba tim tim igba.

Leave a Reply

Your email address will not be published.