BUHARI EKWELA NKWA IDOZI ALA IGBO

Spread the love


Onye isi ala bụ Muhammadu Buharị ekwela nkwa ịrụ ọtụtụ ọrụ ga-eweta mgbanwe ahụrụ anya na mpaghara ọdịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị tupu ya arituo n’ọkwa ọchịchị.

O kwere nkwa, n’akụkụ ala anyị ahụ ga-aka mma mgbe ya ga-arịtu karịa ka ọ dị mgbe ya batara n’ọchịchị.

Obụ Femi Adeshina bụ onye ndụmọdụ pụrụ iche nke onye isi ala gbasara mgbasa ozi gbara ama okwu ndi a, mgbe ana-eme emume imalite ọrụ ụzọ dị kilomita ise na ọkara n’Isieketa dị n’okpuru ọchịchị ime obodo ndịda Isiala Ngwa nke steeti Abia, na ngwụcha izu ụka gara aga.

Buhari kwara arịrị maka etu ụmụ ihe eji enyere ndụ aka si debe imi na anya mgbe ya batara n’ọkwa ọchịchị.

Ọ gara n’ihu kwee nkwa na ya ga edozichaa ụmụ ihe ndi a tupu ya arituo n’ọkwa ọchịchị.

N’okwu ya, ọtụtụ ụmụ ihe eji enyere ndụ aka mebiri emebi na Naijiria mana Buhari eforola ntụtụ ya taa ịhụ na o dozichara ihe ndi a.

Ọ sịrị na otu n’ime ihe na-echu onye isi ala ụra bụ idozi ụmụ ihe ndi a eji enyere ndụ aka dịka okporo ụzọ ụgbọ-ala, nke ụgbọ-igwe nakwa ọkụ latrik.

Ọ sịrị na tupu ndi ọchịchị nọ n’ọkwa ugbu a arịtuo, na ala Igbo agaghị abụkwa ihe ọ bụbu. Ọ sị n’ala Igbo ga-akarịrị mma karịa ka ọ dịbu.

1 Comment

  1. Ya gazie onye nta akuko. Ugbua o doola ewu na okuko anya na obughi so ihe ojoo ka onye isi ala anyi na-eme.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.