Ndi ana-enyo enyo dịka ndi Fulani na-achị ehi ma bụrụkwa ndi nke na-akpa ike n’akụkụ obodo ana-akpọ Obomkpa, n’okpuru ọchịchị ime obodo mgbago ugwu Anịọcha nke steeti Delta, ka-ekwuru na ha agbagbuela otu nwoke dibia oyibo na-arụ ọrụ n’ụlọ ọgwọ Federal Medical Centre Asaba. Ekwukwara na ha tọọrọ ndi enyiRead More →

Ndi òtù jikọrọ ụmụ ntoroọbịa agbụrụ niile nke Naijiria akpọrọ ‘All Nigeria Ethnic Nationalities Youth Organizatio’, ANENYO, n’aha ichafụ nọrọ ụnyahụ kwue na ha ga-ahụkọrịta ndi aka na-achị steeti dịgasị n’ọdịda-ọwụwa anyanwụ ala anyị; ka-ewere gbaa mbọ ihụ na, ọnọdụ: ‘onye nọrọ na be ya’ ndi IPOB kwuru na-aga-enwe maRead More →

Ụnyahụ ka ndi agbụrụ Juu bịarutere na nke Nnamdị Kanụ bụ onye ndu ndi IPOB, n’Isiama Afaraukwu Ibeku, Ụmụahịa nke steeti Abịa. Ndi ọgbakọ a nke sitere n’ụlọ ekpere ana-akpọ Yaweh Yahshua Synagogue bịarutere n’ụlọ onye ndu nke IPOB a maka ime ekpere nke mmemme, ha kpọrọ Shabbat. Ha nọrọRead More →

Ndị na-anya ụgbọala nwere ụkwụ atọ eji keke mara n’Enugwu nakwa ndi ọkwọ ụgbọala tagizi etoola aka na-achị steeti Enugwu bụ Ifeanyị Ugwuanyị maka ọchịchị ọma ya nke mere na ha ejighịzị anya mmiri arụ ọrụ ha na steeti Enugwu. Ha sịrị na site n’ọchịchị obi ọma Ugwuanyị, na ebelatagoroRead More →

Otu Ụmụnwanyị Naịjiriya bi na Saut Afrịka bụ Nigerian Women Association, South Africa nọrọ na nso nso were nye nna otu a bụ Ezealị Jonas Ndụbụeze Udeji, Onowu Ndigbo na Saut Afrịka onyinye nkwanye ugwu pụrụ iche n’ihi oke mbọ ọ na-agba iji kwalite ezigbo mmekọrịta n’etiti ụmụamala Naịjiriya biRead More →

Minisry etiti na-ahụ maka ọrụ ekwuela na akụkọ ana-akọ banyere ahụhụ ndi njem na-ata n’okporo ụzọ awara awara ahụ sị Enugwụ gawa Ọnịcha ga-abụzị akụkọ mgbe ochie n’ime otu izu ụka. Ma rue ugbu a, ọnọdụ ụzọ ahụ nọ n’ime ya na-agba anya mmiri. Mana ka ihe si gbata kwụrụRead More →

ENUGWU: Otu Nigerian Society of Engineers (NSE ) bụ otu jịkọtara ndi omenka, ngalaba Enugwu nọrọ ụnyahụ n’ụlọ ezumezu DEC n’ogbe Indendence Layout, Enugwu were họpụta ndi isi ọhụrụ nke otu a n’oge ha nwere Ọgbakọ Izugbe Kwa-afọ ha. Onye a họpụtara dịka Onyeisioche bụ Omenka Festus Ọzọemena, onye bụbuRead More →

Atọrapụla mmadụ iri na isii bụ ụmụ nwanyị ndi Indigenous People of Biafra, IPOB, bụ ndi akpụpụrụ ụlọ ikpe maaji dị n’Owere, na steeti Imo tata. Onweghṅ ihe ọzọ a gwara ha ka ha mee belu sọ ha lawara onwe ha. Ntọrapụ ha kpaliri mụọ ọñụ n’ime ndi otu haRead More →

Nwunye aka na-achị steeti Anambara bụ Oriakụ Ebelechukwu Obianọ, ana-etu, Osodieme, gara otu ụlọ-ọgwụ ana-akpọ ‘Life International Hospital’ dị n’Ọka, ụnyahụ bụ Wenesdee, bụ ebe ọ nọrọ kwụọrọ otu nwanyi mụrụ ụmụaka ise n’otu nje, ego dị otu nde naira, na puku naira iri isii na ụma, iji gbapụta yaRead More →

Òtù ndi Igbo akpọrọ South East Renewal Group, SERG n’aha nkenke, akpọkuela gọọmenti etiti ka o kwue hoohaa, na ndi otu ụka Alakuba, ana-akpọ Islamic Movement of Nigeria IMN, bụ otu omekome. Otu SERG kwuru na ọ dị ọtụtụ ihe ndi IMN na-eme, ha chọpụtara na ha na-enweta nkwado gọọmentiRead More →

ỤÓtú ụlọ ikpe maaji dị n’Owere, nke ọbụ S. K. Durumba nọ n’isi oche, anọrọla n’ụbọchị Mọndee gara aga kpọchie ụmụ nwanyị ndi nke na-achọ nnwere onwe Biafra; dị otu naari na iri na abụọ n’ọnụ ọgụgụ, n’ụlọ mkpọrọ dị n’Owere bụ isi obodo steeti Imo. Ka nke a na-eme,Read More →

Ndi uwe ojii nakwa ndi DSS ejikọọla aka ọnụ kpụrụ onye ndu otu Biafra Zionist Federation BZF n’aha ịchafụ, bụ Bejamin Ọnwụka. Nke a bụ maka ihi mbọ ha na-agba iguzobe mba Biafra ma makwụnye ọkọlọtọ ya n’obi gọọmenti dị n’Enugwu. Ọbụ n’okporo ụzọ Bisalla Road, nke dị n’Independence LayoutRead More →