K’anyị Lebaa anya na agwụgwa(RIDDLES), ma kọwaa uru agwụgwa bara

Spread the love

Na mbụ anyị chetara na mgbe anyị bụ ụmụaka, na agwụgwa bụ ihe anyị ji egwu egwu. Ugbu a, m gaghị echeta ikpeazụ m nụrụ ka mmadụ kwuru, “Gwam Gwam Gwam”, ọzọ. Ọ bụrụla ihe mgbe ochie ndị ugbu a amaghịzị maka ya. Ya mere n’hoohaa ga-akpọtekwa ya n’ụra.

Agwụgwa dịbara gbooo, ọ dị kemgbe mmadụ bidoro kọba akụkọ ifo. O nweghị omenala màọbụ ndị nọ n’ụwa a na-enweghị nke ha. Ma ndị ọcha ma ndị isi ojii. Ha nile nwere agwụgwa. Ọ na-adị n’ụdị ajụjụ ajụrụ mmadụ, ọ ga-agbagwoju anya tupu azata ya. Ọ na-eme ka mmadụ chebaa echiche nke ọma makana ajụjụ ahụ gbasaara ihe gbara mmadụ òkìrìkiri. Nwatakịrị na-azata agwụgwa nke ọma, na-enwe amamihe, na-echemi echiche ime.
Ọ na-abụkwa ihe eji egwuri egwu, ụmụaka na-eji ya ama aka. Onye jụọ ibe, ibe ya ajụkwa ya. A na-emegide nke a ganye na-amara onye ike ga-agwụ site na-ịda ya màọbụ ichefu ihe ọzọ o ga-ajụ. Nke a na-eme ụbụrụ mmadụ a na-ahọ nkọ ka agụba. Onye a na-ajụ na-eche echiche maka azịza nke ajụrụ ya, ma na-echekwa maka nke ọ ga-ajụ. Ya bụ, ngige n’egwu, ọkụkọ n’egwu.
Taata, m ga-ewepụta agwụgwa iri na ise nke ndị Igbo, m jụọ ha, ịmara na-ịga azanwu ha. Azịza ha ga-abịa na ngwụsị ederede a. Mba mba, m gaghị aza ha, onye mara ha ya za. J

ka anyị nwalee ndị ka ma, gwa m gwa m gwa m, Igbo. Maka ndị isi na-achọ oku, o bụghị maka ndị ụbụrụ eke

1 Comment

  1. Kedụkwanụ gwa m gwa m gwa m ọ bụ? Adị m njikere.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

17 + eighteen =