STEETI ENUGWU: EGWU NDI FULANI EJIDELA NDI NENWE

Spread the love

Ndi Nenwe dị n’okpuru ọchịchị ime obodo Anịnri na steeti Enugwu na-ebizi n’iwe n’ọnụma maka na ndi uwe ojii, ngalaba na-ahụ maka igbochi ndi oji egbe ezu akpọrọ FSARS n’aha nkenke, bịara nwụchikọọ ụfọdụ ndi obodo ahụ. “Arụ ha mere” bụ na ha chọrọ igba mbọ ịkwụsị ndi nchị ehi Fulani ikwe ka ehi ha na-emebi ụmụ nri na akụkụ ha kọrọ n’ugbo ha.

Akụkọ anyị si ebe ahụ nweta n’ekwu, na n’akaghị aka, ekwughị ekwu, ndi Fulani ruru mmadụ iri na ikpa ehi ha wụchiri ma jiri ugbo ha mere ebe ana-azụ ehi.

Ozi a gara n’ihu kwue na ọbụ mgbe ndi obodo a chọpụtara na ehi ndi a na-agazị n’ihu imebiwe akụ n’ụba ha, ka ụmụ ikoroọbịa ha jikotara onwe ha ma gawa ịgwa ha ka ha kwakọrọ ma chịrị ehi ha hapụrụ ha obodo ha.

Ozi a kwukwara na eji nnukwu ego agbapụta ndi a ndi uwe ojii jidere.

Ka ihe siri gbata kwụrụ na Nenwe kịta, ndi obodo ahụ na-ebizi n’oke egwu n’ụjọ maka na osisi ahụ bụ ya mia mkpụrụ mmadụ anwụọ na-esozikwa ifuru.

Leave a Reply

Your email address will not be published.