AKA AKPARALA ONYE OHI BỊARA N’ỤDỊ ỤKỌCHUKWU

Spread the love

N’ụnyahụ ka-anọrọ nwụchie otu nwikorọbịa bịara izu ori n’ebe ana-echi ndi ụkọchukwu, nke kere ekike dịka ụkọchukwu.

Mgbe aka kpara nwoke a, n’ụlọ ụka ukwu ‘Maria Asumpta Cathedral’ dị N’Owere, na syeeti Imo. Ndi nche mere ka nwoke a were anya ya hụ ntị ya ma were eze ya taa ntu ọkụ, werekwa otu eze ya ahụ kpee ekwere.

A na-ahụbu nwoke a dịka onye ụkọchukwu, mana ọ bụzị mgbe ahụrụ ka ọ na achọ ịkpaka ma buru ụkpọala mmadụ ka-amatara na ọbụghị ndi niile yi uwe ọcha nwụda bụ ụkọchukwu, aka were kpara ya.

Egbughị oge ọbụla iwere nwoke a nye ndi agha n’aka. Mgbe ndi amị nyechara ya ntarama ahụhụ n’ebe ahụ ana-echi ndi ụkọchukwu, ha were ya nye ndi uwe ojii ka ha rụtọpụ ọrụ fọrọ n’isi ya.

Nke a mere ka ihe edere n’akwụkwọ nsọ pụta ihe: ‘ha bụ agụ mana ha pụrụ iyiri awọrọ dịka atụrụ bịakwute gị’

1 Comment

Leave a Reply

Your email address will not be published.

3 × 3 =