17 Comments

  1. Author

    1. Okwu baa n’ego, ogbenye e sere ọnụ
    2. Ụmụnna nwezue akụ, anyụfụ alaa
    3. Ị gaghị abụ ogbenye bụrụ amosu
    4. Akụ na-esi obi ike
    5. Ọkụkọ nwa ogbenye bụ ehi ya




    0



    0
  2. 1. Agwa ogbenye ihe eji abu ogaranya, ya asi ka ya buru ogbenye ya bu




    0



    0
  3. (2) Ego bịara ahịa nwere onye ọbụ nke ya.
    (3) Onye ji ego ji okwu.
    (4) Ego anaghị eju afọ.
    (5) Oriri ego adịghị ka mkpata ego.
    (6) Ego ejiri gba ofogeri abụghị ya ka eji aba ụba.
    (7) Ahapụ ndụ kpaa ego, onye iro erie ego.
    (8) Ezigbo aha ka ego.
    (9) Nwata n’ata akara n’ata ego ya.
    (10) Nwata ejighị ego, ya jide ire ọma.
    (11) Agadị nwanyị kawa nka, ọdịka ejighị ego lụọ ya.
    (12) Ego dị n’ogwu.
    (13) Ọnụ ejiri biri ego, abụghị ọnụ eji akwụ ya.




    0



    0
  4. 1. Agbaka m mbo bu ego nri; uba si na chi.
    2. Arusi obula nara nwa ogbenye ehi achoghi ya ndu.
    3. Nwata tunye onu n’okwu o tunye ego ya.
    4. Onye obula atuchara ilu kowara, I mara na ego emere n’isi nne ya lara n’iyi.
    5. Ogaranya mee ka Ogbenye, e lelia ya ka e leriri ogbenye.
    6. Nshiko si na o ga-ano ndu hu ego ole erere ya.
    7. Nkita si ndi ya turu ute wenatara ya ego ya, na ntukwu amarala ya ahu.




    0



    0
  5. 8. Nwepu nwepu na-agwu ego.
    9. Nwa a naghi ahu ego erifgii.
    10. Ebe ego nwata di ka obi ya di.
    11. Ego ejiri me enyi furu ohia.
    12. Onye ji ego ojoo gbara ogo ya nwanyi ekeresimesi erifubeghi ya bu ego.
    13. Umunna nwezuo ego, ubiam na asiri alaa.
    14. Odida ogaranya ka bukwa mmalite ogbenye.
    15. Mkpata akpatachaghi ego, Nricha erichaghi ya.
    16. Isi ego aputaghi, o na bu uru ga-aputa.
    17. Akpataghi ego bu ntukwuwa onu.
    18. O na bu ego nuyaa nwata, o chee na ya abaala ogaranya.
    19. Ego bu obia.
    20. Ogbenye anaghi aza “_Ome okachie”




    0



    0
  6. 21. Uba bu nke.
    22. Okookpa ka a juru si, ” ego ole ka eji alu nwanyi na be unu”? O zaa si na onaghi eri ego obula kama na ihe o na-ewe bu, ” idikwa ike oso?”
    22. Mbe si na iji Ehi kwaa Nna ya di mma, kama na ya enweghi ego Ehi.
    23. Ogaranya buru ala, ji Ogbenye agaghi epu.
    24. Aka juo oyi, Ogbenye ama onu.
    25. Onye nwee ego, o nwee ikwu na ibe.




    0



    0
  7. 26. O na abu nnukwu ite siri n’oku, umu Ogbenye agagburu onwe ha n’ozi.
    27. O na abu nwata na-eri ego onye ozo, O si na uto ego di n’ire.
    28. Onye ji ego ji ogwu.
    29. Ihe onye ubiam ji ebe akwa onye nwuru anwu bu maka ejighi ego.
    30. Mgbe emena ihe ego, o ga-aburiri nwa Ogbenye n’inyo.




    0



    0
  8. 31. Oku ego, anaghi aza ya fiacham!
    32. O na abu Ogbenye enweghi nke o ga-eri, o mee onu ka o naghi ahu ya.
    33. Omegbu nwa Ogbenye, o ga-akpo nke ya ala mmuo?
    34. Ezie mu bu Ogbenye ozi ka m zie Ogaranya, ezie m; ma asi m gwoo ahu bute ya, aju m!
    35. Ube si na o bu naani ya mere ka Ogaranya rachaa ntu ka Ogbenye.
    36. Ogbenye adighi ata anya Ehi.
    37. O na abu Ogaranya chia ochi, umu Ogbenye akupusie onwe ha isi.




    0



    0
  9. 1. Agwa ogbenye ihe e ji aba ọgaranya, ọ sị ka ya hara ka ya ha
    2. Mbidebe ọgaranya abụghị uru, ọ bụrụ ọghọm
    3. Aghara ndụ kpaa akụ, onyeiro erie
    4. ọgaranya kechaa ekpe,ọ nwụghị ihere abụrụ nke ya
    5. Nwa ọgaranya tijie ọdụ, nna ya akwụọ ụgwọ ya




    0



    0
  10. 1. Ọnụ e ji bite akụ, abụghị ọnụ e ji akwụ ya
    2. Ọgaranya jere mba anụ juru akpa bụ ndi ọ na-enye nyere ya
    3. Ogbenye mekarịa mkpọtụ, a tụọrọ ya ụgwọ nna ya ji
    4. Ego dị n’ogwu
    5. Onye kwụọ ụgwọ o ji , o nwere onwe ya




    0



    0
  11. 38. Onye nwere mmadu ka onye nwere ego.
    39. O na abu ogbenye jide ugwo , o na-ewu ewu.
    40. Mmanya mmadu jiri ego ya zuta anaghi egbu ya egbu.
    41. Onye ukpa anaghi ama mgbe o riri ego is I nwa ada ya nwanyi.
    42. Agbaba ita bu ita, si nyekwa m ego bu ego o.
    * 18. Ego bu obia, otu I siri bata ka o si apu.
    43. O na abu ogbenye gbuo Ehi, mpara echie ogbo.




    0



    0
  12. 44. Aghara ndu kpaa aku, onye iro eburu ya.
    45. Okpa aku eri eri, lekwa ka onu di ndi nwuru anwu.
    46. Mmeto Ogaranya ka ogbugbu ya.
    47. Ogaranya ma ibe ya.
    48. Mgbe onye jiri ba Ogaranya, O na-ewu
    49. Achuba aja ipu n’ulo, oke tunye ego ngwere tunye; n’ihi na iku gbaa ulo, oke aburu oke ohia, ngwere aburu ngwere ikpa.
    50. Onye kpara nku ahuhu si ngwere biara ya ugwo.




    0



    0
  13. 51. Onye nwuru anwu kechaa ekpe, ndi di ndu ekegharia ya.
    52. Ogaranya nwuo n’elu, ebutuo ya n’ala.
    53. Mmiri ideyi bute aku, o zuo uwa onu.
    54. O na abu e were ihe onye na-asara kwuo ya ugwo; o ruo.
    55. O na abu a kwepu Dibia onu aku, o buo mgborogwu n’ajo ohia.




    0



    0
  14. 56. Onye ji ego kwaa nna n’ihi na obughi Diokpara gburu.
    57. Kwere kwwre di n’onu aku bu nke onye kwetara mee.
    58. Onye boro mmadu ihe o na-emeghii; ya kwuwa ugwo o na-emeghii.
    49




    0



    0
  15. 49. Onye ugwo ebighi n’ulo.
    50. Onye oke ekele anaghi anwu ugwo amara e meere ya.




    0



    0
  16. 51. E rewe nwanyi ma e repughi, si kponye ya nwunyeedi ya ka o ree ya naani toro.
    52. ” O di ka ya luwa m” anaghi eji ego.




    0



    0
  17. ỌGBỤGBA OKWE: UJU NWANEKEZIE 44, IKECHUKWU BISMARCK ỌJỊ 8, NNAMDỊ ACHỤKỌ 5




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.