NNUKWU ỤKỌCHUKWU N’ARỤSỊ AGBAALA MGBA

Spread the love

Otu nnukwu ụkọchukwu bụ bishọp Nelson Nnanna, edeputala n’ọba ozi ‘facebook ya’, ka o si lụsọ okwu-arụsị ọgụ ma merie ya n’Arọndizuọgụ, n’okpuru mchịchị ime obodo ideatọ nke steeti Imo.

Bishọp Nnanna bụ onye isi n’ụlọ ụka ‘Soulwinners International Church’ dị n’Owere bụ isi obodo steeti Imo.

Nnukwu ụkọchukwu a seputara ma gosikwa onyonyoo, ebe ya na arụsị gbara mgba dịka dike na ibe ya. Ọ sịrị na ya nwere ike merie arụsị a maka na ya nwere ikikere nke Chineke n’ime ya.

Ọ tara ọchị “hahahahaa,” were kwue sị, “alụsolam okwu arụsị nke ekwensu dị N’arọndizuọgụ ọgụ n’anya ọcha ma merie, n’otu aka ahụ, emeriela ike nke ajọ onye ọbụla na ndụ gị, n’aha Jizọs”

2 Comments

  1. Hmmm, òké amala ụma taa akpa nwa dibịa….




    0



    0
  2. Biko Bishopu a , o bu onye Farisii? Makana o bu ha bu ” Nkita na-ericha nsi buru ya n’onu”. Asi m kwuo, aga m asi ka enyochaa akuku a nke oma.




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

five × one =