NDI ỤKA AKWAPỤLA BISHỌP N’ỤLỌ ỤKA

Spread the love

Ihe nkiri mere n’ime otu ụlọ ụka ụbọchị ụka gara aga, na mpaghara Nyandarua nke Kenya; mgbe ndi ụka kwapụrụ bishọp ha n’ụlọ ụka.

Nke a mere n’ụlọ ụka akpọrọ African Indipendent Pentecostal Church of Africa (AIPCA), Mgbe esem-okwu ikpa otu dapụtara n’etiti ndi ụka ahụ

Mgbe bishọp Ayub Kigotho chọrọ ka ọ banye n’ụlọ ụka ahụ ka ọ kaa ụka, ndi otu ụka ahụ nke ekwenyeghị na ya siri ọnwụ ma kwapụ ya n’ụlọ ụka ha.

Ọbụghị sọnsọ na ha kwapụrụ ya, ha malitere igụ egwụ na igba egwu ikpè were na-ekwu na bishọp Yakub bụ onye nsogbu.

Esem-okwu na nkewa ha malitere n’ọnwa mbụ nke afọ a, mgbe ndọrọ-ndọrọ ọchịchị dapụtara n’etiti bishọp Yakub na Suleiman Kimani.

Na-agbanyeghị na bishọp Yakub kpọ ndi uwe ojii bịa ụlọ ụka ahụ ụbọchị ụka gara aga, ndi ụka ahụ foro ntụtụ ha taa ma jụ jụwaa isi na ọ gaghị abanye n’ime ụlọ ụka ha.

Mkpọtụ ha na-eme dọtara ọtụtụ ndi mmadụ bụ ndi bịara ikiri ha. Ndi mmadụ ahụ kwakwara ha emu were na-ekwu na ha enwenwughị ike igosiputa ezigbo omume dịka ndi otu Kraist.

Ndi mmadụ na-akwa ha emu na-asị na ọbụ mụọ nke otu Mau Mau bi n’ime ha.

Otu Mau Mau bụ ndi eji igbu n’iké were mara na mba Kenya.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

five × two =