24 Comments

  1. (1) Atuwa uto, ewepu aghugho




    0



    0
  2. (2) Ugwu muta mgbaji ukwu, agadi nwanyi amuta agakata ezuo ike




    0



    0
  3. (3) Nwata nje nje ka okenye isi awo mara ihe.




    0



    0
  4. (4) Okwu agwara nwa nwere nne ka nwa n’enweghị nne jiri mara ihe




    0



    0
  5. 1. Amamihe anọkwa n’ebe a mụrụ awọ mere na-adọtịghị ya aka n’ụkwụ
    2. Onye aghụghọ na-aghọ, ihe ya a na-efu
    3. Onye aghụghọ nwụọ, onye aghụghọ elie ya
    4. Akọ ( ndi oke amamihe )abụọ anaghị eke ihe dị atọ
    5.Amaghị uche onye nya akpa asụ nri
    6.Onye a kpọrọ ka ọ bọọ anụ, ọ bọrọ na-etinye n’akpa, a kpọọ ya ụbọchị ọzọ ọ mara na nke ọ bọrọ na ọ bọtara ya
    7.E jighi ụkwụ abụọ awụ ogwe
    8. Anaghị awunwe aka abụọ n’ọnụ
    9.Osisi anaghị egwu nwoke n’anya ugboro abụọ
    10.A hụrụ nwa ebili akọ ugboro ole ihe ga-eme tupu ọ mata ihe, ọ sị na ọ gaghịdị eme ya mbụ, na ya ga-esi na ihe mere onye ọzọ mụta ihe
    11. Ebi ogwu ka ụmụnna ya gwara ya na ọ na-epu ogwu, ya hapụ ebe a ga-ejide aka were nye ya ụgwọ ma ahụ rịawa ya
    12.Ọkwa sị ụmụ ya onye tụrụ ji ya tụrụ mgbọrọgwụ, onye ji gwuru ji ya ha eriwe mgbọrọgwụ
    13.Mgbe a na-adụ nwa nwere nna ọdụ ka nke na enweghị nna si ya amụta ihe
    14.oke anaghị eri ihe onye mụ anya
    15.Agbụsị gbaa otule ọ mụrụ akọ
    16. Mma yie nwata, ọ tụghaa ya
    17.Onye metere nwatakịrị nwanyị enyi bụ ya sị ya kparịa ya
    18. Ebe nwata gara pata ejula, ọ gaa ọzọ ọ pata ikpo nsị
    19. Awọ kpọrọ ibe ya wọkọm
    20. Onye ohi tụrụ ibe ya arọ




    0



    0
  6. (5) Atụrụ ọ mara, ya amara ihe, atụrụ ofege ofenye isi n’ọhịa




    0



    0
  7. 1. A gwa ntị ọ nụghi, e bewe isi ya na ntị e soro
    2. Okenye na-eji anya eke oke
    3. Ejula chekwara onwe ya echekwa were ghọrọ kerekpukpu
    3.Ọkwa sị na onye ya riri ji ya bụ ọkọjị
    4. Diochi anaghị ekwucha ihe ọ hụrụ n’elu nkwụ
    5. Ụkwụ na-aga wara wara, anya na-aga wara wara na-ahụ ya




    0



    0
  8. (6) Nwanyi muta ishi ofe mmiri, di ya amuta ipi utara aka wee suru ofe




    0



    0
  9. (7) Onye amamihe n’eji ekete ekuru mmiri




    0



    0
  10. 1. Nkata ga-ekpudo onye aghụghọ.
    2. Nkụ ọnye kpara n’ọkọchị ka ọ na-anya n’udummiri.
    3. Onye ije na aka onye isi awọ ihe ama.
    4. Anụ bu ụzọ na-anyụ mmiri oma
    5. Nne ewu na-ata agbara nwa ya a na-ele ya anya n’ọnụ.




    0



    0
  11. 6. Onye ara na uche ya yị
    7. Anaghị asị nwata ma ihe pụọ n’anwụ.
    8. Onye aghụghọ nwụọ, onye aghụghọ elie ya
    9. Anaghị agwa nwata wepụ aka n’ọkụ.
    10. Uche bụ akpa.




    0



    0
  12. 11. Ọ bụ nkụ agadị nwanyị kpara n’:agbọghọ ka ọ na-anya n’agadị.
    12. Onye ọbula atụ gburu nna ya anaghị eji mpi atu aṅyụ mmanya.
    13. Ọ bụghị ihe nile n’egbu mara mara bụ ọla edo.
    14. Agbụsị gbaa otule ọ mụrụ akọ.
    15. Ọgazị sị na ihe ha ji adị abụọ aga n’ubi bụ maka na ” onye ahụghị nwanne ya ahu.




    0



    0
  13. 16. Ikwu amaghị ibe ezi ya.
    17. Nwayọ nwayọ ka e ji arachaa ofe dị ọkụ.
    18. Kama ehi m ga- agbanari m, e gbubiri m ya ọdụ.
    19. Aghụghọ na nganga ka okenye ji agbara ehi igbo ọsọ.
    20. Ọ bụ n’ọhịa dị uru ka ọkụkọ na-akpa nri.




    0



    0
  14. 21. Ngịga sị na ya enweghị ike ịrịa ọrịa a ga eji sị ya puọ n’aṅwụrụ ọkụ
    22. Nwamkpi sị na njepụga amaka; na ya jepụgara wee mụta ịsọkeli ọnụ elu
    23.Ọkụkọ kwesịrị ịtụ ka eko ya ha.
    24. Ọ na abụ ike gwụ onye aghụghọ ọ chọwa udo.
    25. Ike gwụ nne ewu ọ rachawa ọkwa.




    0



    0
  15. 26. Gbakata gbakata abụghị afa; ọ bụ agba ere bụ afa.
    27. Okokporo gbagharịchaa, ntụ ụtụtụ na-eche ya.
    28. Ndi Igbo na-atụ ilu sị, Ọhịa dịba ka enwe amaghị ya.”
    29. Ọ na abụ amamihe buru ụzọ, uto akwaa.
    30. O ji eze arị elu mara osisi na-elu ilu.
    31. K e bu mmanụ asọ akwa ọcha ka ebu akwa ọcha asọ mmanu.
    32. Ezụkọọ ka a ha mara ihe, e were ilu kwuo okwu gbasaa.
    33. Ejịghị ihe eji agba na ntị agba n’anya.
    34. Ọ kwesịrị ka atụrụ ntụtụ wee nye ṅkịta nri n’ihi na nkịta richaa, mmadụ agaghị erịkwa ya ọzọ.
    35. A naghị aka ụka mgba ebe ala dị nso.
    36. Onye nzuzu amaghị na Ada nne ya bụ ọbịa.
    37. Onye a na eyiri uwe nwụda bụ onye ama; onye ụlọ ọbụle maara ebe apa dịgasị ibe ya na ahu.
    38. Ọkụkọ ọkpa jiri, anaghị ere ya n’ụlọ.
    39. E mee ngwangwa emeghara ọdachị.
    40. O ji Ji agba ụtụtụ matakwa na ọ nwere mgbe Ji ga-agwụ n’ọba.
    41. Elekentịọba sị na ọ bụ kemgbe dinta mụtara atụghị atụ agba ka ya ji mụta efebe ebeghị ebe.
    42. Onye ọbụla ihe n’emeghịị ọ wee mara ihe bu agụghọ wee pụta ụwa.
    43.Nwoke ọbụla nya akpa wee na-asụ ụtara, Ị mara na echiche obi ya gbara gharịị.
    44. Ọ na abụ ero chọwa ighọgbụ ala ọ pụọ na mkpu ka e wee kpọọ ya “ero mkpu.”




    0



    0
  16. 46. Nwa m akarịa m bụ aghụghọ.
    47. Nkịta anaghị anyụ nsị ebe a na- atọsara ya nri.
    48.Ntị eji anụ ihe ahaghị ka okpu ata.
    49. Ama mmiri zoro ezo mara nke e mere mwụpụ.
    50. Akwaturu enyi bụ eziokwu ma ọ kweghị ọbụbọ bụ ụgha.
    51. A na-esi n’ọdụ ama ihe dị ṅkita mma.
    52. Anụ nwere uche anaghị ekwu okwu ma enyi kwuchie ụzọ.
    53. Ikeagwụ dị mma na ọrụrụ ma ọdịghị mma na oriri.
    54. Mbe na ebu ụzọ amara ala na be ndị ọgọ ya tupuu ọ chọwa onye ọ ga-aghọgbụ.
    55. Mmadụ anaghị aṅyụ nsị n’ọhịa ka ya elu.




    0



    0
  17. 56. Mbe na mbe zụkọọ ahịa, uru anaghị adị ya.
    57. Nwanze na-eze isi ya maka echi.
    58. Nwata na amabeghị ihe anaghị ama n’agwọ nwere eze ma ya fọdụ na ọ na-ata mmadụ ata.
    59. Onye biliri ọtọ mara ebe ọ na-aga.
    60. Ọnya taa mmadụ ọ mara na ijiji nwere eze.




    0



    0
  18. 61. Onye mbụ mere anaghị ekwe kr abụọ mee ya.
    62. Okenye a si ya kuru ṅwa ọ sị na eze adịghị ya n’ọnụ; a sị ya tagbuo ya atagbuo?
    63. Ọnweghị onye hụrụ ụgbogụrụ na ajụ ihe na-ami aṅyụ.
    65. Onye ga- aghụ mmadụ ahụ anaghị ezoro ya ọtọ ya.
    66. Onye mara asụ ọ sụọ n’ikwe; onye amaghị asụ, ọ sụọ n’ala.
    67. Okenye ghọgvụrụ ibe ya ji omegbu.
    68. Ụsụ sịrị na ya mara ka ya si jọọ njọ wee were abalị na-efe.
    69. Ụkpala ahụrụ n’ọkụ na-agụ ọkụkọ ma o jide nke ya o rie ya na ndụ.
    70. Ụkwụ ka e ji achọ ihe dara mmiri.




    0



    0
  19. 71. Ude maara ihe obi sụrụ.
    72. A tụrụ ilu ka ọgbaa ofeke gharịị.
    73. A na ama ụma a dara ọchị n’ala ọ bụghị na ọchị kwaturu.
    75. Ọ na abụ nwata kwuo okwu a mara ka uche ya ha
    76. Agwa ekwe bụ ndụ; ekwue anụghị bụ ọnwụ.
    77. Ọ na abụ ekpudo nsi aja, erie mbụghụ.
    78. E jezuo m obodo bụ icha akwu ; n’ihi na ọṅweggị onye ga-anọrọ n’ụlọ mara ihe azụrụ n’ahịa.
    79. Anụmanụ ndị ọzọ anaghị ekukwasị enwe mmiri n’azụ.
    80. Okenye ọbụla ghọgbụrụ ibe ya bụ dibịa.




    0



    0
  20. 81. Ọ bụ nramụụra ka eji ejide agụ dị ndụ kee ya agbụ
    82. Ihe ṅyịrị onye Igbo bụ onye Igbo ibe ya
    83. Ochie dịbịa chụọ aja, ọ dị ka ọ nyere ya ndị mmụọ n’aka.
    84.Ọ dịghị mma ịkpọ ṅkita oku were okpiri chere ya
    85. Ọ mere ihe Dike, ya na uche ehuru.
    86. “Agaghị m eri” ji eze ekere ya ụmụazị, ọ mere gịnị?
    87. Ọ na abụ ṅkita erighịị , ọ na-aṅyara ọkụ
    88.Ike na-adị Dike n’obi; ọ ma kwe ụjọ ekele.
    89. Onye n’amaghi ihe a na-eme gaa ebe a na-eme ihe, e were ya mere ihe eji eme ihe a na-eme.
    90. Mbe sị na ọlụ ọha amaka, mana oriri ọha na-agbakasị ya ahụ.




    0



    0
  21. 91. Azụ enoghi ibe ya, ọ naghị ebu.
    92. Nwa ọmacha ncha, ọ ga-ama ka mmiri si baa n’opi ugbọgụrụ
    93. A turu ilu ka ọ wee gbaa ofeke gharịị
    94. Dịbịa mutara ọzọ ma ọzọ na-egbu dịbịa.
    95. Ọ dị mma ka e were ụtụtụ chọwa ewu ojii n’ihi na chi jie, ya na abalị abụrụ otu.
    96. Ọ na abụ asị onye ohi jide ọkụkọ ọ sị na ọ ga-ata ya arụ.




    0



    0
  22. 97. Okenye daa iwu ụtarị agwụ n’ụlọ.
    98. A maka m ihe n’Ọzụbụlụ bụ ama ama na Nnewi.
    99. Ọha anaghị ama onye ụwa ṅyịrị.
    10. Ọ na-agbọ ihe ewu na-eri.




    0



    0
  23. 1.Agba asọ anya bụ ajọ dibia
    2.Onye a na-agbara ama ọ na-awuli elu, onye a na-ebo ebubo o kwetewo
    3. Nwanyị mụta isi ofe gbara mmiri di ya amụta ipi ụtara aka
    4.Ugwu mụta mgbaji ukwu agadi nwanyị amụta arịkata ezuwe ike
    5.Nwanyị na-eke ogiri mara ijiji anya mpịa
    6.O nweghi onye ma isi ga-abụ eze
    7.Onye nọrọ ebe a na-eke akpa, o kwughi okwu e kere ọnụ ya tinye n’akpa
    8.Madụ anaghị ahapụ ubi ya maka na o ruru ahịhịa
    9.onye kpọọ ọba ya ọkpa, ndi ọzọ a kpọọ ya ọkpọkọrọ
    10.o nweghi ihe e richara agụụ ya laa
    11. Anụ kwọ nwa n’azụ anaghi agba ọsọ
    12.oke anaghi eri ihe onye mụ anya
    13. Onye ọhụhụ hụọ enyi, onye okwukwe e kwee mbe
    14.Anaghị agafe onye mụ ọkụ ebute ụzọ
    15.E ji anya ama ọka chara acha
    16.Awọ anaghị agba ọsọ ehihie na nkịtị
    17.Agha a kara aka anaghị eri nwa ngwụrọ
    18.E welụ, e welụkwa na-ese okwu
    19.onye a ghọgburu bụ onye a gbara
    20. Ọkụ dakwasị nwanyị dakwasị nwa ya, o buru tichapụ nke dakwasịrị ya
    21.Anụ soro enwe ọ majie aka
    22. Enwe sị na ya kwọ nwa ya n’azụ, ya amaghị mgbe o ji ghọrọ ụtụ rachaa
    23. Enwe si sọ nwa ya ga aṅụrụ iyi bụ nwa o bu n’afọ
    24.Ekele ukwu n’ama yị
    25.E jighi abalị arọ anya
    26. Nwayọ nwayọ ka eji aracha ofe dị ọkụ
    27. onye nzuzu amaghị na nwanne ya bụ ọbịa
    28.0kụkọ sị na ya na-atụgbu atụgbu were eri
    29.onye ụgwọ ehi bịa onye ụgwọ akụkọ alaa
    30.nwata rie awọ ọ jụ anụ




    0



    0
  24. ỌGBỤGBA OKWE:UJU NWANEKEZIE 87 N’IME ILU 100, MAZỊ IKECHUKWU ỌJỊ 54 N’IME ILU 55,DỌKỊNTA ACHỤKỌ 7 N’IME ILU 7




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.

twenty − seventeen =