ENUGWU: ỤLỌ ỌRỤ ‘INEC’ AKPỌỌLA OKU KA NDI MMADỤ BỊA WERE AKWỤKWỌ NHỌPỤTA HA

Spread the love

Ụlọ ọrụ na-ahụ maka nhọpụta ala anyị akpọrọ INEC n’aha nkenke, akpọọla ndi bi n’Enugwu oku ka ha were ọsọ were ije bịa were akwukwo ikike nhọpụta ha dị n’aka ụlọ ọrụ ahụ ugbu a

Onye isi ndi ụlọ ọrụ INEC na steeti Enugwu bụ Emeka Ọnọnamadu nọrọ n’Enugwu, n’ụbọchi Tọọsdee gara aga kpọọ oku a.

N’isi nso a, ka ya bụ ụlọ ọrụ kwuru na ha ka ji akwụkwọ ikike nhọpụta ndi mmadụ, ihe karịrị puku naarị abụọ bụ sọ nke ndi steeti Enugwu.

Ọnọnamadụ kwuru na-agbachaala mbọ niile dị mkpa ihụ na ndi mmadụ nwere ike iwere akwụkwọ nhọpụta ha na-ataghị ikikere Eze ọbụla.

Ọ yọrọ ka ndi madụ gasie ike bia were akwụkwọ ndi a, karịa ihapụ ha n’ụlọ ọrụ ha. Ọ gara n’ihu kwue na ọbụ akwụkwọ a bụ ikikere ndi mmadu nwere ihọpụta onye maọbụ ndi ndu ha n’odi n’ihu.

Ọnọnamadụ kwuru na nkwusị ana-akwado ịkwụsị ndebanye aha ndi mmadụ maka ịgbara akwụkwọ ikike a, ma ọnwa Ọgost dị n’abali iri na asaa, agaghị egbochi ndi mmadụ ịbịa were akwụkwọ nhọpụta ha.

Ọ sịrị na ndi mmadụ ga na-ewere akwukwo nhọpụta ha rue mgbe ọ ga-afọdụ naanị otu izu ụka, ka emee nhọpụta nke afọ puku abụọ na iri na itoolu.

Ọ sịrị n’ọbụ ọrụ dịịrị ndi mmadụ ịbịa were akwụkwọ nhọpụta ha.

Ọ gara n’ihu dọọ ndi tozuru etozu igbara akwụkwọ nhọpụta, ma ha emebeghị nke a, aka na ntị, ka ha gbaa mbọ were obere oge a fọrọ mee nke a tupu emechie ndebanye aha maka nhọpụta a.

Ọ sịrịkwara n’ụlọ ọrụ ha na-agba mbọ izisara ọhaneze ozi a, iji hụ na onweghi ọdachi ga-adịrị onye ọbụla gbasara ime nhọpụta nke na-abịa abịa. Ọ sị na nke a ga-enye aka ịkwusị mkpesa na emere Okeke nke a. Ma mee Okafọ nke ọzọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.

11 + nineteen =