NWOKE NA-ECHERE OGBUGBU YA AGBAALA NAARỊ AFỌ N’ỤLỌ NGA

Spread the love

N’ụwa niile gbaa gburugburu, mmadụ ịgba naarị afọ adịghị fecha fecha. Ana-eweputa oge, soro onye dị etu a ñụra nke bụ ezigbo ọñụ.

Mana Chi abụghị otu, nke akara aka ji abụ ofu! Ya mere na otu nwa amadị nke aha ya bụ Mazi Selesin Egbunuche nọrọ na nnukwu ịta nkịkịrị eze na n’ime iru uju mee ncheta na ya agbaala otu naarị afọ n’isi nso a, n’abalị anọ nke ọnwa asatọ n’afọ a.

Mazị Selesin bụ onye Akọkwa n’okpuru ochịchị ime obodo mgbago ugwu Ideatọ nke steeti Imo, ma bụrụkwa onye nga na-eche ogbugbu n’ụlọ nga dị n’Enugwu.

Amara Mazị Selesin na diọkpara ya tinyekwara otu nwanne ha nwoke dị afọ iri asatọ na asaa, ikpe ọnwụ mgbe ha na ndi mmadụ na-alụ ọgụ maka izọ ala, bụ ebe ha nọrọ tigbue mmadụ. Mazị Selesin anọruela afọ iri na asaa n’ụlọ nga, ebe ọ na-echere ọnwụ ya.

Ebe onye dị ndụ ka nwere olile anya, aka na-atụkwa anya na Mazị Selesin ka nwere ike ịbụ onye nwere onwe ya. Nke a bụ maka na òtù ótú kwuru onwe ya ana-akpọ “Global Society for Anti-Corruption” (GSAC), abatala n’okwu a ma na-arịọ gọọmenti etiti nakwa Rochas Okorọcha bụ aka na-achị steeti Imo, ka ha were obi ebere ha tọrapu nwoke a bụ Selesin, nwa ya nwoke nakwa nwa nne ha nwoke na nga nakwa n’aka nke ọnwụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.