MAKARFI EBEERELA ALA IGBO AKWA

Spread the love

Aka ahụ chịburu steeti Kaduna na mbụ, ma bụrụkwa onye PDP nwere olile anya ịzọ ọkwa onye isi ala Naijiria, bụ Ahmed Makarfi ekwuela na ya ahụla ntarama ahụhụ dịṅ na isoro okporo ụzọ mee njem na mpaghara ala Igbo.

Nwa-amadị a bụ sinetọ Makarfi nọrọ ụnyahụ kwue ihe ndi a n’isi ụlọ ọrụ ndi otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị PDP dịṅ n’Owere na steeti Imo.

Ọ sịrị na naanị isi Enugwu were ụgbọala gaa Owere ezuela ihe kpatara ya jiri tadoo eze na-idozi ụzọ dịka isi okwu ya na ichụ nta nkwado ya dịka onye isi ala.

Makarfi sịrị na mgbe ya si Enugwu aga Owere, na ya ji anya ya hụ ntị ya maka njọ ụzọ.

N’okwu ya, ọ sịrị na ndi ụfọdụ gwara ya were ụgbọelu mee njem ahụ, mana ya jụrụ ajụ n’ihi na ya chọrọ isoro ndi Igbo taa ahụhụ ha na-ata ka ya were mara ka ya ga-esi kwụọ onye ukwu wara ma ya bụrụ onye isi ala.

Ọ sịrị na ọ dị mkpa ịmara ihe ndi ana-achị achị chọrọ, ma kwukwa na PDP bụ ezigbo otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị nke onye kwue uche ya.

Ọ sị na ọ ka-abụ ihe nhia ahụ ịchịkọba ogbakọ PDP ahụ ma ọbụrụ na PDP abụghị otu na-enye onye ọbụla ohere ikwu uche ya.

Ọ sị na ha bụ ndi otu PDP ga-ekwenyere n’ihe otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị ha kwuru, ma ọbụragodu na ha enwetaghị mmeri.

O kwuru na ha ga-ekwere n’obụ Chineke na-enye ọchịchị.

Makarfi sịrị na mgbe ya ga-ahapụ otu ndọrọ-ndọrọ ọchịchị PDP bụ naanịṅ ma ya chọrọ ịgba arụkwaghị m nye ndọrọ-ndọrọ ọchịchị.

Ọ sị na isi sekpụ nti n’atụmatụ ndi PDP bụ ihazigharị Naijiria. O wee kwue na PDP ga-ejikọọ ụmụ Naijiria ọnụ ka ha were kpaa ka aga-esi hazie Naijiria n’ụzọ ọ ga-esi akwụrụ chịm.

Ọ gwara ndi niile bụ ndi otu PDP mana ha ekwenyeghị n’ihazigharị Naijiria, ka ha si na PDP kwara pụọ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.