Bishọọpụ a sị lụrụ nwanyị abụọ ebutewo nsogbu n’ụka

Spread the love

 

Udo adịghịzị n’ụlọụka ndi Anglịkan KraịstChurch Cathedral, Akwete,dị na Dayọsis Ụkwa, Abịa Steeti. Ndi ụka ahụ na-ebuso bishọọpụ ha bụ Rt Rev Samuel Kelechi Eze agha. Ha machiela ya ịka ụka ma ọ bụkwanụ mee ihe ọbụla n’ụlọụka ahụ n’ihi ebubo a na-ebo ya na ọ lụrụ ụmụnwanyị abụọ ndi nke ya na ha bi n’obi bishọọpụ ebe ahụ.

Ebubo ndi ọzọ e boro ya gụnyere ịkpọ ndi ụkọchukwu agụụ nakwa amaghị ọchịchị.

Nsogbu ruziri nke bụ na ndi ụka ahụ mere ngagharị iwe. N’akwụkwọ mkpesa nke ha degaara Onye ndu Ụka Anglịkan na Naịjiriya, e dere n’abalị iri n’asaa nke ọnwa Ọktoba, afọ 2017, ndi ụka ya iwe ji boro ya ebubo ịlụ ụmụnwanyị abụọ tinyekwara iri ego ụka.

Ewezuga akwụkwọ mkpesa ahụ, ndi okenye atọ si ebe ahụ nke onye ndu ha bụkwa Onyeisi ndi Ọgbakọ ndi Ọchịagha ụka (knight) na dayọsis ahụ bụ Ichie Okere Eruba, jikwa ụkwụ ha ga hụ ya bụ Onye ndu ndi ụka Anglịkan na Naịjiriya maka okwu a.

Kaosiladị, Bishọọpụ sịrị na ebubo ahụ bụ nkọgheri nke onye bu ya n’isi bụ Aachbishọọpụ Ikechi Nwosu nke Aachịdayọsis Aba nke ọ sị na ihe butere ya bụ ekworo nakwa ịkpa oke n’udi ebe onye si. Ọ bakwara mba sị, “Kedu ka Bishọọpụ ga-esi lụọ nwanyị abụọ?”

Onye ndu ndi ụka Anglịkan na Naịjiriya, Amara Chi Nịkọlasị Okoh guzobere otu nnyocha ndi bishọọpụ asaa si mpaghara ụka Anglịkan Aba nke Aachịbishọọpụ na-elekọta mpaghara ahụ bụ Aachịbishọọpụ Ikechi Nwosu nọ n’isi ya iji lebaa anya na ya bụ akwụkwọ mkpesa.

Akwụkwọ Nchọpụta(report) ha kọwara na Eze, ” achọghị ịgwa ha ihe nile ha chọrọ ịmata n’aka ya;bishọọpụ na nwunye ya adịghị na mma, muchi muchi karịrị n’okwu banyere ego na dayọsis ahụ, Bishọọpụ Eze akọwanwughi ihe jikọrọ ya na Nwa-ada Gladys Chinazaekpere Nwosu”

Image result for anglican bishops in Nigeria

Ndi Bishpọọpụ Anglịkan

 

N’akwụkwọ mkpebi ya sitere n’akwụkwọ nchọpụta ahụ, Onye ndu ụka Okoh, site n’ozi anyị nwetara kwadoro alo nile dị na ya ma gwakwa Eze ka “o jiri obi umeala kwuo eziokwu banyere mmekọ dị n’etiti ya na Nwa-ada Gladys Chinazaekpere Nwosu ma chọkwaa ihu Chineke, na ha abụọ ga-akwụsị inwe mmekọrịta ọbụla, na ọ ga-abịakwa rịọ ndi ụka mgbaghara”

Anyị nụrụ na ihe buteziri ngagharị iwe ahụ bụ na obi adịghị ndi ụka Anglịkan na Dayọsis Ụkwa mma na kemgbe ọnwa Jenuarị e wepụtara akwụkwọ mkpebi ahụ na obi akaghịzị Onye ndu ụka Nịkọlasị Okoh itinyezi mkpebi ndi ahụ n’ọrụ.

Leave a Reply

Your email address will not be published.