18 Comments

  1. 1. Ana achọ ego eji alụrụ okoro nwunye, ndi dị ime n’amụ nanị nwoke




    0



    0
  2. 2. Nwunye awọ sị di atọka ụtọ ya jiri luo nke ya kwọrọ ya n’azụ.




    0



    0
  3. 3. Anaghị eji amụ ukwu etinye akwụna ụjọ.
    4. Nwunye anyi nwunye anyi,ka abalị ruo anyị amara onye ọbụ nwunye ya




    0



    0
  4. 5. Akwụrụ ọtọ tụwa nwanyị ime, ya amụta akwụna.




    0



    0
  5. 6. Mkpi mbugobe adịghị agba ewu.




    0



    0
  6. (1) Tupu gị na nwanyị ajado(nwanyị isi mkpe) enwee mmekọ nwoke na nwanyị, buru ụzọ jụọ ihe gburu di ya.




    0



    0
  7. 1. Ogoli lụọ di abụọ ọ mara nke ka mma
    2. Nwayị di ya nwụrụ sị ana-ekwu ka e si eli di ya si kwukwuo maka onye ga-akuchi ya
    3.Nwayị olu ọma, di ya anaghị ajụrụ ya nri
    4.Nwa ekweghị mbe ọmụmụ, ọ sị na nwunye di ya na-ele ya ajọ anya
    5. Nwanyị gafee onye mụrụ o ruo onye na-alụ
    6. Nwoke lụrụ nwayị ụkwụ nchịgbara (knocked knees ) mara otu ha abụọ si edina
    7. Anaghị ekpuchi afọ ime aka
    8. Madụ anaghị edu onye kaya mma eje be enyi ya nwanyị
    9. Onye metere nwatakịrị nwanyị enyi sị ya kparịa ya
    10. Agaghị ekwo na xxx mbe pere mpe a nara ya nwunye ya




    0



    0
  8. 1. Ọmụmụ rawa ahụ, nwanyị abịawa nso, nwoke abịawa nso.
    2. Onye emeghị ka onye ara, ụmụnna ya agaghị alụṅye ya nwanyị.
    3. ihe ji ọgụ di na nwunye bụ na di ya arịdabeghị elu nkwụ.
    4. Ama nwanyị gbara di ya bụ fụghem.
    5. Ihe Di ghọrọ ogoli azụọla n’ahịa.




    0



    0
  9. 6. Di na Nwunye macna ike na-esi isi kama onye ga-ekwu.
    7. Nlata gụwa nwanyị ya na Dị ya sere okwu, ọ gaa ikpa nkụ na owere Di ya.
    8. Ihe nwoke jụchara ma werekwa bụ nwunye ya.




    0



    0
  10. 1. Nwata kaara di ya onye ọ jụrụ ọgaghị akaara ya onye o kwetere
    2. Nwayị mara obi di ya a sị na ọ gwọọrọ ya ọgwụ
    3. Okoro emeghi ka ọ ga edina nwunye di nna ya agaghị alụrụ ya nwanyị
    4. Nwayị muta isi ofe gbara mmiri di ya amụta ịpị utara aka
    5. Nwayị obi ọma anaghị ara ahụ atụrụ ime




    0



    0
  11. 9. Nwoke na-alụ nwanyị mechiri ahụ, ọ dị ka ndị obodo ya na-asọ anụ nchi.
    10. Nwanyị makarịrị di ya n’ụzọ, ihe chere di di ya ewere ya.
    11. Nwanyị na-azọ mgbala buru ụzọ zọọ yi ya.
    12. Nwanyị gbata mma n’ibe ya nye di ya.
    13. Nwata nwanyị lụrụ di ọhụụ sị, ” Ihe nke a ekwesịghịrị ya, ọ bụ nne ya ka ọ kwesịrị?
    14.Nwanyị buru ụzọ daa isi mkpe na-erere ibe ya ihe.
    15. Ụta agaghị ata nwanyị jiri abalị mụo nwa n’ihi na ọ bụ mgbe ahịa jiri tụọ ya ka o jiri lọta.
    16. Ọ na abụ emezitere ṅwanyị ọhụụ ebe ọ na-asa ahụ mmiri ya a na-ada vọm-vọm.
    17. Nwanyị ọbụla dị ịme tọpụrụ akwa ma ọ mụghị nwa ihere abụrụ nke ya.
    18. Ụzọ nwanyị abụghị ụzọ nwa/
    19. Nwoke lụchaa ọgụ; nwanyị enwere akụkọ.
    20. Ihe na-agụ nwanyị na-agụ onye tụbara ya ime.




    0



    0
  12. 1. Nwayị mụworo nwa, e jighi isi xxx eyi ya egwu maka na isi xxx akaghị isi nwa
    2. Alaka utu la-acha ụrị ( Ngalaba utu na-agate aka)
    3. Ọkwụrụ mịara m, mịara nwunye di m
    4. A gaghị ekwo na enyi m nwanyị hụrụ n’anya were ghọọ ube e dooro arusị
    5. Agwa bụ mma nwayị




    0



    0
  13. 1. Anaghị asikwa nwayị mụru bwa n’ahịa ya kpọkọta ọkpa
    2. Di bụ ugwu
    3. Onye kpubara n’ụlọ ọmụgọ maara ihe ọ mụrụ
    4.Nwoke mụtara ọtụtu ụmụ nwanyị anaghị ebe akwa ndi ọgọ
    5. Ọgọ bụ chi onye




    0



    0
  14. 21. Nwanyị ike ukwu ọ na-atụ egwu, ọbụghị mmadụ ga-alụ ya?
    22. Ọ bụ naanị nwanyị mara nna nwa ya.
    23. Nwanyị aga sị na nwa ma ụma aga ya n’ihi na ya enweghị ara ilu.
    24. Nwanyị ụga ọmụmụ anaghị ekwe nwa ya rahụ ụra.
    25. Nwanyị dị ime anaghị ama ọchị nwa na-achị n”afọ.
    26. Nwanyị ọbụla di ya chọrọ ikpọ asị apụghị isite ya n’ofe dị ụtọ.
    27. Nwanyị obiọma na-amụ nwa akaghị aka mgbe ọbụla.
    28. Ebe ọbụla ọ dị nwanyị ka sị lụọ ya Di, a na-eme ya enyi ebe ahụ obị a na-atọ ya ụtọ.
    29. Ọ na abụ nwanyị kawa nka, ọ dị ka ejighi ego lụọ ya.
    30. Ọ na abụ nkụ kọọ ajọ nwanyị, onyaa ụkọ Di ya.
    31. Nwanyị mara ihe bụ okpu eze Di ya.
    32. Nwanyị sị na ikpe ya na Di ya abụghị nke mmadụ; ọ bụ ndị mmụọ ga-ekpere ha ya?
    33. Ọ na abụ nwanyị lelịa Di ya, ike akpọọ ya nkụ.
    34.Ọ bụrụ na mgba aja adagbụghị nwanyị ajadụ, ọnaghị ama uru Di bara.
    35. Ọ na abụ nwanyị chọọ ịkparị nwanyị aga, ọ sị na nwa na-ata ata n’afọ.
    36. Okokporo na-asị ka a lụọrọ ya nwanyị ọsọsọ; onweburu nke ya na ya bi?
    37. Onye ọbụla na amaghị ka nwunye ya ga-adị n’agadị, ya lee ọgọ ya nwanyị anya nke ọma.
    38. Nwoke ji nwanyị na abọ na-ebukarị ọnụ alaba ụra.
    39. Ihe e ji agakwu nwanyị dị ime abụghị ka ọ mụọ ejima kama ọ bụ ka obi na-atọ ya ụtọ.
    40. Onye ọbụla lụchara ọrụ ewere nwanyị kwụọ ya ụgwọ; e ji ya ụgwọ ma nyekwa ya ọlụ ọzọ.




    0



    0
  15. 41. A na-ebu ụzọ ahụ ihu nwanyị mụrụ nwa tupu ajụọ ya ihe ọ mụrụ.
    42. Nwanyị aga sị na ya amụtaghị nwa ma na ahụ ya dịrị ya.
    43. Ọ na abụ nwanyị karịa di ya, mgbala ya akaa.
    44. Nwanyị mụrụ ejima asaa enweghị ihe mere na abalị a na-akọrọ ya akọrọ.
    45. Nwanyị sie ajọ nri, ọ sị na ọbụ nke gụrụ ya.




    0



    0
  16. 46. Afọ atụtala ime otube agbaa ama.
    47. Mbe na-ebu ụzọ amara ala na be ndị ọgọ ya, tupu ọ chọwa onye ọ ga- aghọgbu.
    48. Nwoke mara obi nwunye ya ọ chịnye ya igodo ụlọ.
    49.Nnekwu ọkụkọ sị okọkpa na ọbụrụ ṅa ya mara na ihe a na-akpọrọ ga-ebi ọsọsọ; na ya kara ihapụ igba isi ụlọ ọkirikiri.
    50




    0



    0
  17. 50. Otu mmụ ṅwa, otu mpụ atụrụ.
    51. Nnekwu ọkụkọ kwuru sị na ọbụghị ọlụlụ ọkọọkpa na-alụ ya na-ewe ya iwe, kama na ọ bụ mmebọ ọ na-emebọ ya n’ihu ọha.
    52. Nwoke ka e jidere nwunye ya na nwoke ọzọ n’ọhịa; ọ wee jụọ nwunye ya sị, ” nke a bụkwa?” Nwụnye ya sị ya, ” ọ bụ ebe m na-eze gị.”
    53. Ọ na abụ ọnye chi ọjọọ chọba nwpntị ọ ga-alụ, ogirisi amara akwa na-achọ di.
    54. E rewe nwanyi ma erepụghị ya, sị kpọnye ya nwunyeedi ya ka ọ ree ya nanị tọrọ.
    55. Ọkọọkpa ka a jụrụ, ” ego ole ka eji alụ ṅwanyị na be ụnụ?” Ọ zaa sị na ọ naghị eri ego ọbụka kama na ihe ọ na-ewe bụ ” idịkwa ike ọsọ?”




    0



    0
  18. Author

    ỌGBỤGBA OKWE: Uju Nwanekezie 53, Mazị Ikechukwu Bismarck Ọji 25, Dọkịnta Achụkọ 6, Chidera Ụnamba 1




    0



    0

Leave a Reply

Your email address will not be published.