AGA-ENWE EZUMIKE NDI ỌRỤ MAKA ORIRI NDI ỤKA ALAKỤBA NA TUUSDEE NAKWA WENESDEE

Spread the love


Gọọmenti etiti eweputala ụbọchị Tuusdee, abalị iri abụọ na otu, nakwa Wenesdee abalị iri abụọ na abụọ nke ọnwa Ọgọọst anyị nọ n’ime ya dịka ụbọchị ezumike ndi ọrụ n’ala anyị niile. Nke a bụ maka oriri ndi ụka Alakụba akpọrọ ‘Eid-el-Kabir’ eji echeta mgbe Ebraham ji nwa ya bụ Aizik chọọrọ Chukwu aja.

Minista na-ahụ maka ihe na-eme n’ala anyị bụ ọchịagha Abdulrahman Dambazau lagoro ezumike ọrụ kọwapụtara ihe ndi a, site n’ozi nke onye ji ọkwa pamanent seketrị minisrị ahụ bụ Dọkịnta Mohammed Umar weputara ụnyahụ bụ Tọọsdee.

N’okwu ya, Dambazau kpere ụmụ Naijiria ekpere udo n’oge mmemme a, ma rịọkwa ụmụ Naijiria ka ha jiri ohere a gosipụta ịhụnanya na ichụ aja maka ịdị n’otu na mmepo nke ala anyị.

Ọ yọrọ ụmụ Naijiria ma ndi bi n’ala anyị ma ndi bi na mba ndi ọzọ, ka ha na-akwado onye isi ala bụ Muhammadu Buhari na mbọ ọ na-agba iweta udo na ịdị n’otu nke Naijiria.

Leave a Reply

Your email address will not be published.