NWA NNE GBURU NWA NNE YA N’IHI EGO NLEKỌTA ADỊGHỊ

Spread the love

Ndi uwe ojii steeti Enugwu na-ama imi n’ala ugbu a, ịmara ka mmiri siri baa n’opi ụgbọgọrọ n’ogbugbu egburu otu nwa-amadịṅ aha ya bụ Chizọba Ogbonna Izuchukwu. Ọ bụ nwa nne ya nwoke bụ Rafel Izuchukwu, nke okpuru ọchchị ime obodo mgbago ugwu Igbo-Eze na steeti Enugwu gburu ya.

N’ụbọchị Wenesdee gara aga ka ọnụ na-ekwuru ndi uwe ojii steeti Enugwu bụ Ebere Amaraizu gbara ama okwu a n’Enugwu. O kwuru n’ọbụ ka ọnwa Ọgọọst afọ a dị n’abalị atọ ka-emere arụ a.

N’okwu ya ọ sịrị na nwa-amadị a, ana-enyo enyo kwuru n’ọbụ ya gburu nwa nne ya ma lie ya n’isi ụtụtụ, ụbọchị Wenesdee ka Ọnwa Ọgọọst a dị n’abalị atọ.

Ebere Amaraizu kwuru na nwoke a kọwara iwe ya, nke bụ na nwa nne ya ayala ọya ọtụtụ oge nke na ego eji elekọta ya adịzịghị.

Aka kpara nwoke a mgbe ama gbaara ndi uwe ojii.

Obodo ahụ ejiri udo mara, bụ Ugwuagbo-Inyi nke mgbago ugwu okpuru ọchịchị ime obodo Igbo-Eze bara n’ime ibe akwa na iru uju mgbe ha nụrụ maka ogbugbu nakwa olili nwa-amadị a bụ Chizọba Ogbonna Izuchukwu.

Onye ogbu mmadụ a bụ Rafel Izuchukwu na-enyezịrị ndi uwe ojii aka n’ọrụ ime nchọpụta maka ogbugbu Chizọba.

Leave a Reply

Your email address will not be published.